Lot we pua, gwa di umu-ya, ndi nālu umu-ya ndinyom, okwu, si, Bilienu, si n'ebe a pua; n'ihi na Jehova nēbibi obodo a. Ma ọ di ka onye nākwa emò n'anya di umu-ya.
N'ìhi gini ka ndi Ijipt ganēkwu, si, Ọ bu ime ha ihe ọjọ ka O mere ka ha pua, ib͕u ha n'ugwu, na ime ka ha si n'elu uwa gwusia? Si n'idi-ọku nke iwe-Gi chigharia, chegharia n'ihe ọjọ a I nēchè imegide ndi-Gi.
Jehova we si Moses, Si umu Israel, Unu onwe-unu bu ndi kwesiri olu ike: asi na ọ bu otù ntabi-anya ka M'gārigo n'etiti gi, M'gēme kwa ka i gwusia; ma ub͕u a wepu ihe-ichọ-nma-gi nile n'aru gi tọb͕ọ, M'we mara ihe M'gēme gi.
Mọ-ozi nke Jehova we pua, tib͕ue n'ọmuma-ulo-ikwū Asiria orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ atọ, na nnù ndikom abua na ọgu iri: madu we bilie n'isi-ututu, ma, le, ha nile bu ozu nwuru anwu.
Jehova we si Moses, Doghachi nkpa-n'aka Eron n'iru ihe-àmàm ka ọ buru ihe-ndebe, iburu umu nnupu-isi ihe-iriba-ama; ka i we me ka ntamu nile ha si n'ebe M'nọ bìsia, ka ha we ghara inwu.
M'we nu olu ọzọ ka o nēsi n'elu-igwe dà, si, Ndi nkem, sinu nime ya puta, ka unu we ghara iso ya nwekọ nmehie-ya nile, ghara kwa inata ufọdu nime ihe-otiti-ya nile: