Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 15:4 - Bible Nso

4 onye ahu nke nēweta nso onyinye-ya iji biaru nso gēweta kwa nso Jehova onyinye-inata-iru-ọma, bú otù uzọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour agwara n'otù uzọ n'uzọ anọ nke otù hin nke manu:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Onye wetara onyinye a aghaghị iweta nʼihu Onyenwe anyị aja mkpụrụ ọka nke bụ ezi ụtụ ọka ruru lita abụọ nke e ji mmanụ ruru otu lita gwakọtaa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 15:4
21 Iomraidhean Croise  

n'ihi nka i gēme ngwa were ego a zuru oke-ehi na ebulu na umu-aturu, na onyinye-inata-iru-ọma-ha na àjà-ihe-ọṅuṅu-ha, i gēweta ha nso ebe-ichu-àjà nke ulo Chineke-unu nke di na Jerusalem.


otù uzọ n'uzọ iri nke otù ephad utu oka flour agwara n'otù uzọ n'uzọ anọ nke otù hin nke manu asuru asu gādiri otù nwa-aturu ahu; ya na otù uzọ n'uzọ anọ nke otù hin nke manya-vine, ka ọ buru àjà-ihe-ọṅuṅu.


Ha gēme kwa umu-nne-unu nile ka ha si na mba nile bia ibu onyinye-inata-iru-ọma enyere Jehova, n'elu inyinya, na n'ub͕ọ-ala, na n'ub͕ọ-ala nwere ihe-okpukpu, na n'elu inyinya mule, na n'elu anu di ngwa, rue ugwu nsọm, bú Jerusalém, ka Jehova siri, dika umu Israel si ewebata onyinye-inata-iru-ọma-ha n'ulo Jehova n'ihe di ọcha.


I gēdozi-kwa-ra ya onyinye-inata-iru-ọma kwa-ututu kwa-ututu, otù uzọ n'uzọ isi nke otù ephah, na manu, otù uzọ n'uzọ atọ nke otù hin, iji gwọ utu ọka flour; ọ bu onyinye-inata-iru-ọma anēnye Jehova mb͕e nile n'ukpuru ebighi-ebi.


ma ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya ka ọ gāsa miri: onye-nchu-àjà gēweta anu ahu nile nso, sure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà; àjà-nsure-ọku ka ọ bu, àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova.


Ma n'ubọchi nke-asatọ ọ gēwere umu-ebulu abua zuru okè, na otù nwa-aturu zuru okè nke bu nne, nke b͕ara otù arọ, na uzọ atọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma, nke agwara manu, na otù log nke manu.


Ma mb͕e madu gēweta nso onyinye-ya iji biaru nso, bú onyinye anēnye Jehova inata iru-ọma, utu ọka flour ka onyinye-ya iji biaru nso gābu; ọ gāwukwasi ya manu, tiye kwa frankincense n'elu ya:


I gētiye manu n'elu ya, tukwasi ya frankincense: onyinye-inata-iru-ọma ka ọ bu.


Onyinye-inata-iru-ọma-ya gābu uzọ abua n'uzọ iri nke ephah utu ọka flour agwara manu, bú àjà-ọku anāchuru Jehova ibu ísì utọ: àjà-ihe-ọṅuṅu-ya gābu kwa manya-vine, otù uzọ n'uzọ anọ nke hin.


Ọ buru na ọ bu aturu ka ya onwe-ya nēweta nso ibu onyinye-ya iji biaru nso, ọ gēweta kwa ya nso n'iru Jehova:


Nka bu kwa iwu onyinye-inata-iru-ọma: umu-ndikom Eron gēweta ya nso n'iru Jehova, n'iru ebe-ichu-àjà.


N'ihi na site n'ọwuwa anyanwu we rue ọdida-ya aham di uku n'etiti mba nile; ọ bu kwa n'ebe nile ọ bula ka anēweta nso aham ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ na onyinye-inata-iru-ọma di ọcha: n'ihi na aham di uku n'etiti mba nile, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


na uzọ atọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour, bú onyinye-inata-iru-ọma, nke agwara manu, iji chu oke-ehi ọ bula; na uzọ abua n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour, bú onyinye-inata-iru-ọma, nke agwara manu, iji chu otù ebulu;


Otù nime umu-aturu ahu ka i gāchu n'ututu, chu kwa nwa-aturu nke-ọzọ n'etiti ehihie na anyasi;


nāgughi àjà-nsure-ọku ọnwa ọhu, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, dika ikpé-ha si di, ibu ihe isì utọ, àjà-ọku anāchuru Jehova.


onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;


ka m'we buru onye nēfè Kraist Jisus òfùfè ijekuru ndi mba ọzọ, nālu kwa ọlu onye-nchu-àjà nke ozi ọma Chineke, ka ewe me ka iche-ndi-mba-ọzọ-n'iru-Chineke buru ihe agānara nke-ọma, ebe edoro ya nsọ nime Mọ Nsọ.


Ma unu echezọla ime ihe di nma na ime ka unu na ndi ọzọ nwekọ ihe-unu: n'ihi na àjà di otú a nātọ Chineke ezi utọ.


Osisi olive we si ha, M'gāgha manu nkem, bú nke ha ji sọpuru Chineke na madu nimem, je ifeghari n'elu osisi nile?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan