Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 15:36 - Bible Nso

36 Nzukọ ahu nile we me ka ọ pua je n'azu ọmuma-ulo-ikwū, ha we were nkume tub͕ue ya, ọ we nwua; dika Jehova nyere Moses iwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

36 Ya mere, ọgbakọ ahụ kpọpụrụ ya nʼazụ obodo jiri nkume tugbuo ya, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 15:36
6 Iomraidhean Croise  

Ndikom abua ahu, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, we bata, nọdu n'iru ya: ndikom ahu ndi jọb͕uru onwe-ha we b͕a àmà megide ya, bú Nebot, n'iru ndi Israel, si, Nebot b͕akutere Chineke na eze azu. Ha we me ka ọ pua rue azu obodo, ha were nkume tub͕ue ya, o we nwua.


I gāsi kwa umu Israel, Nwoke ọ bula n'etiti umu Israel, ma-ọbu n'etiti ndi-ọbìa ndi nọ dika ọbìa n'Israel, nke nēnye Molek otù nwa nime nkpuru-ya: aghaghi ime ka ọ nwua: ndi ala-unu gēwere nkume tub͕ue ya.


Jehova we si Moses, Aghaghi ime ka nwoke ahu nwua: nzukọ Israel nile gēwere nkume tub͕ue ya n'azu ọmuma-ulo-ikwū.


Ndikom nile nke obodo-ya gēwere nkume tub͕ue ya, ka ọ we nwua: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi; Israel nile gānu kwa, we tua egwu.


Joshua we si, Gini mere i mekpaworo ayi aru? Jehova gēmekpa gi aru ta. Israel nile we were nkume ub͕ue ya; ha we sure ha n'ọku, were kwa nkume tub͕ue ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan