Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 15:31 - Bible Nso

31 N'ihi na ọ bu okwu Jehova ka ọ lelíworo anya, n'ihi kwa na ọ bu ihe O nyere n'iwu ka o mebiworo; agēbipu nkpuru-obi ahu ebipu, ajọ omume-ya gādikwasi ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

31 Nʼihi na ha eledala okwu Onyenwe anyị anya, mebie ihe o nyere nʼiwu. A ghaghị ibipụ onye dị otu a, mmehie ha ga-adịkwa ha nʼisi.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 15:31
19 Iomraidhean Croise  

Gini mere i ji lelì okwu Jehova, ime ihe jọrọ njọ n'anya-Ya? i werewo mma-agha tib͕ue Uraia onye Het, nwunye-ya ka i werewo-kwa-ra n'onwe-gi na nwunye; ma ya onwe-ya, i werewo mma-agha umu Amon b͕ue ya.


N'ihi na ha nupuru isi n'okpuru okwu Chineke, Lelì kwa ndum-ọdu nke Onye kachasi ihe nile elu:


Mb͕e eruworo Jehova ilu ọlu; Ha emebiwo iwu-Gi.


N'ihi na ajọ omumem nile agabigawo n'elu isim: Dika ibu arọ́ ha dikaram arọ́.


Onye ọ bula nke gāsugwa nke di ka ya, ma-ọbu onye ọ bula nke gēwere ufọdu nime ya tiye n'aru onye ala ọzọ, agēbipu ya n'etiti umu-nna-ya.


Onye nēleda okwu Chineke anya nēmebi onwe-ya: Ma onye nātu egwu ihe enyere n'iwu, onye ahu ka agākwughachi ugwọ.


N'ihi nka ka Onye Nsọ nke Israel ji si otú a, N'ihi na unu juru okwu a, tukwasi obi na nmeb͕u na nsihie-uzọ, we nādabere ya;


Ayi nile kpafuru akpafu dika ìgwè aturu: ayi chere iru, onye ọ bula n'uzọ nke aka ya: ma Jehova emewo ka ajọ omume nke ayi nile dakwasi ya.


Nkpuru-obi ahu nke nēmehie, ya onwe-ya gānwu: nwa agaghi-ebu ufọdu n'ajọ omume nna-ya, nna agaghi-ebu kwa ufọdu n'ajọ omume nwa-ya; ezi omume nke onye ezi omume gādi n'isi ya, nmebi-iwu nke onye nēmebi iwu gādi kwa n'isi ya.


ọ buru kwa na unu aju ukpurum nile, ọ buru kwa na nkpuru-obi-unu asọ ikpém nile oyi, unu ewe ghara ime ihe nile M'nyere n'iwu, ka unu we mebie ọb͕ub͕a-ndum;


Ha gārapu kwa ala ahu, ubọchi-izu-ike-ya nile gātọ kwa ya utọ, n'itọb͕ọ-n'efu ahu mb͕e ha nānọghi ya; ahuhu ajọ omume-ha gātọ kwa ha onwe-ha utọ: n'ihi na, ọbuná n'ihi na ikpém nile ka ha juru, ọ bu kwa ukpurum nile ka nkpuru-obi-ha sọrọ oyi.


Mb͕e madu gēmehie, site n'inu olu ọb͕ub͕a-iyi, mb͕e ya onwe-ya bu onye-àmà, ma ọ bu na ọ huwo ma-ọbu na ọ mawo, ọ buru na o gosighi ya, o gēbu kwa ajọ omume-ya:


Ma nwoke nke di ọcha, nke nānọghi kwa n'ije, ma ọ rapuwo ime ememe ngabiga, agēbipu kwa madu ahu n'etiti umu-nna-ya: n'ihi a o wetaghi nso onyinye iji biaru nso Jehova na mb͕e-ya akara àkà, nwoke ahu gēbu nmehie-ya.


Ma nwoke ahu nke nēme nganga, n'egeghi nti onye-nchu-àjà ahu nke nēguzo ije ozi n'ebe ahu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, ma-ọbu n'egeghi nti onye-ikpe ahu, nwoke ahu gānwu kwa: i gēkpochapu kwa ihe ọjọ ahu n'Israel.


Ya mere onye nāju, ọ bughi madu ka ọ nāju, kama ọ bu Chineke, Onye nēnye Mọ Nsọ Ya ka Ọ ba nime unu.


Onye Ya onwe-ya, dika àjà achuru, būru nmehie nile ayi n'aru-Ya n'elu osisi ahu, ka ayi, ebe ayi nwuworo n'ebe nmehie nile di, ka ayi we di ndu n'ebe ezi omume di; Onye eji ọnyá-utari-Ya me ka unu nwe ezi ndu.


N'ihi na ọ gākawori nma ma ọ buru na ha akāmazughi uzọ ezi omume, kari imazu ya, we si n'ihe di nsọ ahu enyere n'iwu, nke enyere ha n'aka idebe, laghachi.


N'ihi ya M'we ṅuara ulo Ilai iyi, na agaghi-ewere àjà ma-ọbu onyinye-inata-iru-ọma kpuchie ajọ omume ulo Ilai rue mb͕e ebighi-ebi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan