Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 15:29 - Bible Nso

29 Ma onye amuru n'ala n'etiti umu Israel, ma ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti ha, otù iwu ka unu gēnwe bayere onye nēme ihe n'amaghi-ama.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

29 Ọ bụ otu iwu a dịrị onye ọbụla mehiere na-amaghị ama, maọbụ nwa afọ Izrel, maọbụ onye ọbịa nke bi nʼetiti unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 15:29
12 Iomraidhean Croise  

Ọzọ kwa, ihe bayere onye ala ọzọ, nke ọ bughi na ndi-Gi, bú Israel, ka o sitere, ma o siwo n'ala di anya bia n'ihi aha-Gi;


Otù iwu ka ha gēnwe, bú onye amuru n'ala na ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti unu.


Ọ gābu-kwa-ra unu ukpuru ebighi-ebi: n'ọnwa nke-asa, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, unu gēweda nkpuru-obi-unu n'ala, ghara kwa ije ozi ọ bula, ma ọ bu onye amuru n'ala, ma-ọbu ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti unu:


Madu ọ bula nke nēri ihe nwuru onye-ya, ma-ọbu ihe anu-ọhia dọb͕uru, n'etiti ndi amuru n'ala ma-ọbu n'etiti ndi-ọbìa, ọ gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi: ọ we di ọcha.


Gwa umu Israel okwu, si, Mb͕e madu gēmehie n'amaghi-ama megide ihe ọ bula nime ihe Jehova nyere n'iwu, si, Emela ha; ọ we me otù nime ha:


Nime nkpọkọta nka, otù ukpuru diri unu, di-kwa-ra ọbìa nke nọ dika ọbìa, bú ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ nile unu: dika unu si di, otú a ka ọbìa ahu gādi n'iru Jehova.


Onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra nkpuru-obi ahu nmehie-ya, bú nke nēme ihe n'amaghi-ama, mb͕e ọ nēmehie n'amaghi-ama, n'iru Jehova, ikpuchiri ya nmehie-ya; agāb͕aghara kwa ya.


Ma nkpuru-obi ahu nke nēwere aka npako me ihe, ma ọ bu onye amuru n'ala ma-ọbu ọbìa, Jehova ka onye ahu nēkwulu; agēbipu kwa nkpuru-obi ahu n'etiti ndi-ya.


Ma mb͕e ọbìa gānọ n'etiti unu dika ọbìa, me-kwa-ra Jehova ememe ngabiga; dika ukpuru ngabiga ahu si di, na dika ikpé-ya si di, otú a ka ọ gēme: otù ukpuru ka unu gēnwe, ma ọbìa, ma onye amuru n'ala.


ma onye nāmaghi, me kwa ihe kwesiri ihe-otiti, agāpia ya utari ole-na-ole. Ọzọ, onye ọ bula enyere ihe uku, n'aka-ya ka agāchọ kwa ihe uku: onye ha nye-kwa-ra ihe uku n'aka idebe, n'aka-ya ka ha gāju ihe nke ka.


Israel nile, na ndi-okenye-ha, na ndi-ọchi-agha-ha, na ndi-ikpé-ha, nēguzo kwa n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ nke ib͕e ahu na ncherita-iru ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, ma ọbìa ma onye amuru n'ala; nkera-ha na ncherita-iru ugwu Geraizim, nkera-ha ọzọ na ncherita-iru ugwu Ibal; dika Moses, bú orù Jehova, nyere iwu na mbu, igọzi ndi Israel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan