Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 15:15 - Bible Nso

15 Nime nkpọkọta nka, otù ukpuru diri unu, di-kwa-ra ọbìa nke nọ dika ọbìa, bú ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ nile unu: dika unu si di, otú a ka ọbìa ahu gādi n'iru Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Ọgbakọ ụmụ Izrel ga-enwe otu iwu ga-adịrị unu na ndị ọbịa bi nʼetiti unu. Nke a bụ ụkpụrụ ebighị ebi ga-adịrị ọgbọ niile na-abịa. Unu na ndị ọbịa ga-abụ otu nʼihu Onyenwe anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 15:15
17 Iomraidhean Croise  

n'ihi nka ka ndi-Ju mere ka o guzosie ike, ha we nara ihe a bayere onwe-ha, baye-kwa-ra nkpuru-ha, baye-kwa-ra ndi nile ndi nārapara n'aru-ha, ka o we ghara igabiga, bú na ha ganēme ememe n'ubọchi abua ndia dika odide-akwukwọ-ha si di, na dika mb͕e-ha ezubere ezube si di, n'arọ nile ọ bula;


Ubọchi a gāburu unu ihe-ncheta, unu gēme kwa ya ka ọ buru ememe unu nēmere Jehova: n'ọb͕ọ nile unu ka unu ganēme ya ka ọ buru ememe site n'ukpuru ebighi-ebi.


Unu gēdebe kwa ihe a ka ọ buru ukpuru n'ebe i nọ na n'ebe umu-gi nọ rue mb͕e ebighi-ebi.


Jehova we si Moses na Eron, Nka bu ukpuru ngabiga ahu: ọ dighi onye ala ọzọ gēri ya:


Otù iwu ka ha gēnwe, bú onye amuru n'ala na ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti unu.


ha gādi n'aru Eron na n'aru umu-ya ndikom, mb͕e ha nābà n'ulo-ikwū nzute, ma-ọbu mb͕e ha nābiaru nso ebe-ichu-àjà ahu ije ozi n'ebe nsọ ahu, ka ha we ghara iburu ajọ omume, we nwua: ukpuru mb͕e ebighi-ebi ka ọ gāburu ya, buru kwa nkpuru-ya gānọchi ya.


Otù ikpé diri unu, dika anēkpe ọbìa, otú a ka agēkpe onye amuru n'ala: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.


Ọ bu umu-ndikom Eron, bú ndi-nchu-àjà, gēwere opì abua ahu fua; ha gābu-kwa-ra unu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ nile unu.


ọzọ mb͕e ọbìa nọ n'ala-unu dika ọbìa, ma-ọbu onye ọ bula nọ n'etiti unu rue ọb͕ọ nile unu, mb͕e ọ gēme àjà-ọku nke ihe ísì utọ anēsurere Jehova; dika unu si eme, otú a ka ọ gēme.


Ma onye amuru n'ala n'etiti umu Israel, ma ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti ha, otù iwu ka unu gēnwe bayere onye nēme ihe n'amaghi-ama.


Jehova we gwa Eron okwu, si, Ma Mu onwem, le, enyewom i ihe-ndebe nke àjà-nbulim nile, bú nke diri ihe nile edoro nsọ nke umu Israel, gi ka M'nyeworo ha ibu òkè otite-manu, nye kwa umu-gi ndikom, n'ukpuru ebighi-ebi.


Ma mb͕e ọbìa gānọ n'etiti unu dika ọbìa, me-kwa-ra Jehova ememe ngabiga; dika ukpuru ngabiga ahu si di, na dika ikpé-ya si di, otú a ka ọ gēme: otù ukpuru ka unu gēnwe, ma ọbìa, ma onye amuru n'ala.


Onye-Ju ma-ọbu onye-Grik apughi idi, orù ma-ọbu onye nwe onwe-ya apughi idi, nwoke na nwanyi apughi idi: n'ihi na unu onwe-unu nile bu otù onye nime Kraist Jisus.


ebe onye-Grik na onye-Ju, obibì-úgwù na ebìghi-úgwù, onye nāsu asusu ọzọ, onye Sitia, orù, onye nwere onwe-ya, nāpughi idi: ma Kraist bu ihe nile, di kwa nime madu nile.


Israel nile, na ndi-okenye-ha, na ndi-ọchi-agha-ha, na ndi-ikpé-ha, nēguzo kwa n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ nke ib͕e ahu na ncherita-iru ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, ma ọbìa ma onye amuru n'ala; nkera-ha na ncherita-iru ugwu Geraizim, nkera-ha ọzọ na ncherita-iru ugwu Ibal; dika Moses, bú orù Jehova, nyere iwu na mbu, igọzi ndi Israel.


O rue, site n'ubọchi ahu we ga n'iru, na o doro ya ibu ukpuru na ibu ikpé nye Israel, rue ta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan