Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 14:8 - Bible Nso

8 Ọ buru na ihe ayi atọ Jehova utọ, Ọ gēme kwa ka ayi ba n'ala nka, Ọ gēnye kwa ayi ya; bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ọ bụrụ na ihe banyere anyị na-atọ Onyenwe anyị ụtọ, ọ ga-edu anyị bata nʼala ahụ, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 14:8
15 Iomraidhean Croise  

O we me ka m'puta rue ebe sara mbara: Ọ nādọputam, n'ihi na ihem tọrọ Ya utọ.


Ka Jehova, bú Chineke-gi, buru onye agọziri agọzi, Onye ihe-gi tọrọ Ya utọ, itiyekwasi gi n'oche-eze Israel: ọ bu n'ihi na Jehova huru Israel n'anya rue mb͕e ebighi-ebi ka O doro gi eze, ime ihe ekpere n'ikpe na ezi omume.


rue mb͕e m'biara chiri unu je n'ala dika ala-unu, bú ala ọka na manya-vine ọhu, ala achicha na ubi-vine, ala manu olive na manu-aṅu, ka unu we di ndu, ghara inwu: unu ege-kwa-la Hezekaia nti, mb͕e ọ nārafu unu, si, Jehova gānaputa ayi.


Turu onwe-gi rue Jehova aru; Ya me ka ọ b͕apu: Ya naputa ya, n'ihi na ihe-ya atọwo Ya utọ.


M'we ridata inaputa ha n'aka ndi Ijipt, na ime ka ha si n'ala ahu rigorue ala di nma nke sa-kwa-ra mbara, rue ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya; rue ebe nke ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus.


Agaghi-agu kwa gi aha Nwanyi arapuru arapu ọzọ; agaghi-agukwa ala-gi aha Ala tọb͕ọrọ n'efu ọzọ: n'ihi na gi ka agākpọ Hefzi-ba, agākpọ kwa ala-gi Beula: n'ihi na ihe-gi nātọ Jehova utọ, agālu kwa ala-gi dika nwunye.


Obi gātọkwam utọ n'aru ha ime ha nma, M'gēji kwa obim nile, ji kwa nkpuru-obim nile, kua ha n'ala nka n'ezie dika osisi.


Jehova, bú Chineke-gi, nọ n'etiti gi, Ọ bu dike nke nāzọputa: O gēji ọṅù nwe obi-utọ n'aru gi, Ọ gedere du n'ihu-n'anya-Ya, Ọ gēji iti-nkpu-ọṅù teghari egwu ọṅù n'aru gi.


Ha we kọrọ ya akukọ, si Ayi bara n'ala ahu ebe i zigara ayi, ọzọ kwa, ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya ka ọ bu; nka bu kwa nkpuru-ya.


Ọzọ kwa, ọ bughi ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nēru nime ya ka i meworo ka ayi ba, i nyeghi kwa ayi ihe-nketa, bú ubi na ubi-vine: ì gārukpọ anya ndikom ndia? ayi agaghi-arigo.


Gini kwa ka ayi gēkwu n'ile ihe ndia anya? Ọ buru na Chineke diri ayi, ònye nēmegide ayi?


Nání na ihe nna-unu-hà di Jehova ezi utọ ka O we hu ha n'anya, O we rọputa nkpuru-ha nọchiri ha, bú unu onwe-unu, n'etiti ndi nile, otú ọ di ta.


Ma ub͕u a, nyem ugwu a, nke Jehova kwuru okwu bayere ya n'ubọchi ahu; n'ihi na i nuru n'ubọchi ahu na ndi Anak nọ n'ebe ahu, na obodo di uku nke ewusiri ike: eleghi anya Jehova gānọyerem, m'gānapu kwa ha ala-ha, dika Jehova kwuru.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan