Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 14:42 - Bible Nso

42 Unu arigola, n'ihi na Jehova anọghi n'etiti unu; ka ewe ghara itib͕u unu n'iru ndi-iro-unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

42 Unu arịgokwala, nʼihi na Onyenwe anyị anọghị nʼetiti unu. Ndị iro unu ga-emerikwa unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 14:42
9 Iomraidhean Croise  

o we pua izute Esa, si ya, Nurunum, Esa na Juda na Benjamin nile: Jehova nọyere unu, mb͕e unu nọyere Ya; ọ buru kwa na unu achọ Ya, Ọ gēme ka unu chọta Ya; ma ọ buru na unu arapu Ya, Ọ gārapu unu.


Ọzọ, I nēme ka ọnu mma-agha-ya laghachi azu, I meghi kwa ka o guzosie ike n'agha.


N'ihi na ndi Amalek na ndi Kenean nọ n'ebe ahu n'iru unu, unu gāda kwa site na mma-agha: n'ihi na unu esiwo n'iso Jehova laghachi, n'ihi ya Jehova agaghi-anọyere unu.


Jehova we sim, Si ha, Unu arigola, unu ebu-kwa-la agha; n'ihi na Mu anọghi n'etiti unu; ka aghara itib͕u unu n'iru ndi-iro-unu.


Iwem gādi kwa ọku megide ha n'ubọchi ahu, M'gārapu kwa ha, zopu irum n'aru ha, ha gābu kwa ihe agēri eri, ọtutu ihe ọjọ na ahuhu gāchọta kwa ha; ha gāsi kwa n'ubọchi ahu, Ọ̀ bughi n'ihi na Chineke-ayi anọghi n'etiti ayi ka ihe ọjọ ndia chọtaworo ayi?


Umu Israel apughi kwa iguzosi ike n'iru ndi-iro-ha, ha nāb͕akuta azu n'iru ndi-iro-ha, n'ihi na ha aghọwo ihe ewezugara ka ebibie ha: M'gaghi-anọyere unu ọzọ, ma ọ buru na unu ekpochapughi ihe ahu ewezugara nyem n'etiti unu.


Biko, Onye-nwe-ayi, gini ka m'gēkwu, mb͕e Israel b͕akutasiri azu-ha n'iru ndi-iro-ha?


O we si, Ndi Filistia nādakwasi gi, Samson. O we teta n'ura-ya, si, M'gāpu dika m'nēme ub͕ò ub͕ò, we meghari aru. Ma ya onwe-ya amaghi na Jehova esiwo n'ebe ọ nọ wezuga Onwe-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan