Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 14:37 - Bible Nso

37 ọbuná ndikom ahu, bú ndi nēme ka akukọ ọjọ bayere ala ahu puta, nwuru n'ihe-otiti ahu n'iru Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

37 Ndị ikom ndị ahụ e si nʼọnụ ha gbasaa akụkọ ọjọọ banyere ala ahụ, ka e ji nrịa nrịa na-efe efe tigbuo nʼihu Onyenwe anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 14:37
17 Iomraidhean Croise  

Nnù madu abua na ọgu iri gāda n'akuku-gi; Orú nnù madu na nnù ise gāda kwa n'aka-nri-gi; Ma ọ gaghi-abiaru gi nso.


N'ihi nka ka Jehova ji si otú a, Le, M'gaje iji nmehie Shemaia onye-Nehelamait leta ya, leta kwa nkpuru-ya; ọ gaghi-enwe nwoke ọ bula nēbi n'etiti ndi nka, ọ gaghi-elekwasi kwa ezi ihe ahu anya, bú nke Mu onwem nēmere ndim, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): n'ihi na okwu nwezuga ka o kwuworo megide Jehova.


Ọku we si n'iru Jehova puta, ripia ha, ha we nwua n'iru Jehova.


Ha we me ka akukọ ọjọ putara umu Israel bayere ala ahu nke ha ledoro, si, Ala ahu, nke ayi gabigaworo nime ya iledo ya, ala nke nēripia ndi bi ya ka ọ bu; ọzọ ndi nile ayi huru n'etiti ya bú ndikom toro ogologo.


M'gēwere ajọ ọria nēfe efe tib͕ue ha, M'gānapu kwa ha ihe ha nwere, M'gēme kwa gi ka i ghọ mba di uku di kwa ike kari ha.


Ma Joshua nwa Nun na Keleb nwa Jefune di ndu site na ndikom ahu ndi jeworo iledo ala ahu.


Ọku we si n'ebe Jehova nọ puta, ripia ọgu ndikom iri-na-abua na iri ahu nēweta nso ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.


Ma ndi nwuru anwu n'ihe-otiti ahu di orú nnù na nnù iri-na-isi na ọgu iri-na-ise, nāgughi ndi nwuru anwu n'okwu Kora.


Ndi Israel we so Moses se okwu, ha we kwue, si, Ọ gādi ayi nọ̄ nma ma asi na ayi ekubiwo mb͕e umu-nne-ayi kubiri n'iru Jehova!


nne-inyinya-ibu-gi we hum, wezuga onwe-ya n'irum ub͕ò atọ ndia: ọ buru na o wezugaghi onwe-ya site n'irum, n'ezie ub͕u a ọ bu kwa gi onwe-gi ka m'gēb͕uwori, ma ya onwe-ya ka m'gēmewori ka ọ di ndu.


Ma ndi nwuru n'ihe-otiti ahu di orú nnù uzọ atọ.


Unu atamu-kwa-la, dika ufọdu n'etiti ha tamuru, onye-nbibi ahu we la ha n'iyì.


Ma ihe ndi kari n'etiti ha adighi Chineke ezi nma: n'ihi ya akwaturu ha n'ọhia.


Ma òle ndi ka ọnuma di Ya n'obi megide ọgu arọ abua? ọ̀ bughi ndi mehiere, ndi ozu-ha dara nime ọhia?


Ma òle ndi ka Ọ ṅuru iyi na ha agaghi-abà n'izu-ike-Ya, ma ọ bughi ndi nēkweyeghi?


Ma anamezube ichetara unu, ọ bu ezie na unu matara ihe nile nání otù mb͕e, na Onye-nwe-ayi, mb͕e Ọ zọputarari otù ndi n'ala Ijipt, emesia O we la ndi nēkweghi ekwe n'iyì.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan