Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 14:3 - Bible Nso

3 Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka Jehova nēme ka ayi ba n'ala nka, ida site na mma-agha? Ndinyom-ayi na umu-ntakiri-ayi gāghọ ihe-nluta-n'agha: ọ̀ gaghi-adi ayi nma ilaghachi n'Ijipt?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Gịnị mere Onyenwe anyị ji akpọbata anyị nʼala a ime ka anyị daa nʼihu mma agha. Ndị nwunye anyị na ụmụ anyị ga-aghọ ndị a dọtara nʼagha. Ọ garaghị akara anyị mma ịlaghachi azụ nʼIjipt?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 14:3
14 Iomraidhean Croise  

ha we ju inu ihe, ha echetaghi kwa oké ọlu-Gi nile nke I luru n'etiti ha; ha we kwesie olu-ha ike, do onye-isi nime nnupu-isi-ha ilaghachi n'ọbubu-orù-ha: ma Gi onwe-gi bu Chineke nke nb͕aghara nmehie, Onye nēme amara nwe kwa obi-ebere, Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, Onye nāba uba n'ebere, I rapughi kwa ha.


Ùb͕ò ole ka ha nānupu isi n'okpuru Ya n'ọzara? Ùb͕ò ole ka ha nēme ka o wuta Ya n'ala tọb͕ọrọ n'efu?


umu Israel we si ha, Ọ gādi ayi nọ̄ nma ma asi na ayi nwururi n'aka Jehova n'ala Ijipt, mb͕e ayi nọduru n'akuku ite anu, mb͕e ayi rijuru nri afọ; n'ihi na unu emewo ka ayi puta ba n'ọzara nka, iwere agu me ka nkpọkọta nka nile nwua.


ha si ha, Jehova lekwasi unu anya, kpe ikpe: n'ihi na unu emewo ka ísì-ayi sì ísì ọjọ n'anya Fero, na n'anya ndi-orù-ya, itiye mma-agha n'aka-ha ib͕u ayi.


si, É-è; kama ọ bu n'ala Ijipt ka ayi gābà, ebe ayi nāgaghi-ahu agha, ayi agaghi-anu kwa olu opì-ike, agu ihe-oriri agaghi-agu kwa ayi; ọ bu kwa n'ebe ahu ka ayi gēbi:


Jehova ekwuwo okwu bayere unu, unu ndi Juda fọduru, si, Unu abàla n'Ijipt: maranu nke-ọma na ab͕aworom unu àmà ta.


Ha we kwe ire-ha, dika uta-ha, ib͕a okwu-ugha dika àkú; ma ọ bughi n'ebe ikwesi-ntukwasi-obi di ka ha diworo ike n'ala: n'ihi na ha esiwo n'ihe ọjọ pukuru ihe ọjọ, ma Mu ka ha nāmaghi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


rue otù ọnwa zuru ezù, rue mb͕e o gēsi n'imi-unu puta, ọ we ghọrọ unu ihe-isọ-oyi: n'ihi na unu ajuwo Jehova Nke nọ n'etiti unu, unu we kwa ákwá n'iru Ya, si, N'ìhi gini kwa ka ayi siworo n'Ijipt puta?


ọ̀ bu ihe ntà na i mewo ka ayi si n'ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya rigoputa, ime ka ayi nwua n'ọzara nka, ma i ghaghi ime kwa onwe-gi onye-isi-ayi?


Ndi Israel we so Moses se okwu, ha we kwue, si, Ọ gādi ayi nọ̄ nma ma asi na ayi ekubiwo mb͕e umu-nne-ayi kubiri n'iru Jehova!


Ndi Israel we kwue okwu megide Chineke, megide kwa Moses, si, N'ìhi gini ka unu meworo ka ayi si n'Ijipt rigota inwu n'ọzara nka? n'ihi na achicha adighi, miri adighi kwa; ike agwusiwo kwa nkpuru-obi-ayi n'achicha nka di nfé.


onye nna-ayi-hà nāchọghi iṅa nti, kama ha nupuru ya n'ebe ha nọ, we laghachi azu n'Ijipt n'obi-ha,


Ma umu-ntakiri-unu, ndi unu siri na ha gāghọ ihe alutara n'agha, na umu-unu ndikom, ndi nāmaghi ezi ihe na ihe ọjọ ta, ndi ahu gābà n'ebe ahu, ha ka M'gēnye kwa ya, ha onwe-ha gēnweta kwa ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan