Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 14:21 - Bible Nso

21 ma otù ọ di, Mu onwem nādi ndu, uwa nile gējuputa kwa n'ebube Jehova;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Ma dịka m na-adị ndụ na dịka ọ bụ eziokwu na ụwa niile ga-ejupụta nʼebube Onyenwe anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 14:21
16 Iomraidhean Croise  

Ub͕u ka ha doziworo nzọ-ukwum nile; Nkpuru-obim erudawo n'ala: Ha egwuwo olùlù n'irum; Ha adabàwo n'etiti ya. Selah


Ihe agọziri agọzi ka aha nsọpuru Ya bu kwa rue mb͕e ebighi-ebi; Ka uwa nile juputa kwa na nsọpuru-Ya. Amen, na Amen.


ma otú ọ di ọ bu n'ihi nka ka M'guzoworo gi, ka M'we me ka i hu ikem, ka ewe kọ kwa akukọ aham n'uwa nile.


Welie anya-gi abua le buruburu, we hu: ndia nile achikọtawo onwe-ha, biakute gi. Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta,) n'ezie ha nile ka i gēyiri dika ihe-ichọ-nma, were ha ke, dika nwunye ọhu.


Otù we kpọ ibe-ya òkù, si, Nsọ, nsọ, nsọ, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha di: ùjú uwa nile bu ebube-Ya.


Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ buru si na Konaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, bu nb͕a-aka-akàrà n'aka-nrim, ma ọbuná n'ebe ahu ka M'gādọpu gi;


Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ay Jehova puta), n'ezie ọ gaghi-abu kwa ọlu-unu ọzọ itu ilu a n'Israel.


Dika Mu na nna-unu-hà kpere ikpe n'ọzara nke ala Ijipt, otú a ka Mu na unu gēkpe ikpe; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Si ha, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ọnwu nke onye nēmebi iwu adighi-atọm utọ ma-ọli; kama ọ nātọm utọ mb͕e onye nēmebi iwu si n'uzọ-ya chigharia, we di ndu: chigharianu, sinu n'uzọ ọjọ nile unu chigharia; ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu gānwu, ulo Israel?


Otú a ka i gāsi ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mu onwem nādi ndu, n'ezie ndi nọ na nkpọnkpọ ebe nile gāda site na mma-agha, M'gēwere kwa onye nọ n'ọhia nye anu-ọhia ka ewe ripia ya, na ndi nọ n'ebe nile ewusiri ike na n'ọb͕à nile, n'ajọ ọria nēfe efe ka ha gānwu.


N'ihi nka, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), n'ihi na ebe nsọm ka i meruworo n'ihe-gi nile nke jọb͕uru onwe-ha, na n'ihe-árú-gi nile, n'ihi ya Mu onwem aghaghi kwa ibilata gi; anyam agaghi-eme kwa ebere; ọzọ kwa, Mu onwem agaghi-enwe ọmiko.


N'ihi na uwa gējuputa n'ọmuma ebube Jehova, dika miri si ekpuchi oké osimiri.


N'ihi nka, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, puta), n'ezie Moab gādi ka Sọdọm, umu Amon gādi kwa ka Gọmọra, ihe-onwunwe nke akuba, na olùlù-nnú, na ebe tọb͕ọrọ n'efu rue mb͕e ebighi-ebi: ndim fọduru gāluta ihe-ha n'agha, ndi mbam fọduru gēketa kwa ha.


Si ha, Mu onwem nādi ndu, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, dika unu kwuworo na ntim, otú a ka M'nāghaghi ime unu:


Ka ala-eze-Gi bia. Ka eme ihe nāchọ, dika esi eme ya n'elu-igwe, ka eme kwa otú ahu n'uwa.


N'ihi na anameweli akam elu nye elu-igwe, We si, Mu onwem nādi ndu rue mb͕e ebighi-ebi,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan