Jehova we si Moses, Le, ubọchi-i gānwu nābiaru nso: kpọ Joshua, guzo-kwa-nu onwe-unu n'ulo-ikwū nzute, ka M'we nye ya iwu. Moses na Joshua we je, guzo onwe-ha n'ulo-ikwū nzute.
O we nye Joshua nwa Nun iwu, si, Di ike, nwe kwa ume: n'ihi na gi onwe-gi gēme ka umu Israel ba n'ala ahu nke M'ṅuru ha iyi inye ha: Mu onwem gānọye-kwa-ra gi.