Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 13:28 - Bible Nso

28 Otú ọ di, ndi bi n'ala ahu di ike, ewusi-kwa-ra obodo nile ha ike, ha di kwa uku ri nne: ọzọ kwa, umu Anak ka ayi huru n'ebe ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

28 Ma ndị bi nʼobodo ahụ siri ike. Obodo ha buru ibu bụrụkwa nke e wusiri ike. Anyị hụkwara ụmụ ụmụ Anak nʼebe ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 13:28
12 Iomraidhean Croise  

Ishbi-benob, nke di n'etiti umu Rafa, onye ọtùtù ube-ya di ọgu shekel ọla iri-na-ise n'ọtùtù, ekewo-kwa-ra onye ahu ihe-agha ọhu, o we si na ya gētib͕u Devid.


N'ebe ahu ka ayi hu-kwa-ra ndi-Nefilim, bú umu Anak, ndi sitere na ndi-Nefilim: ayi we di n'anya onwe-ayi dika ogugu, ọ bu kwa otú a ka ayi di n'anya-ha.


Òle ebe ayi onwe-ayi nārigo? umu-nne-ayi emewo ka obi-ayi ghara idi ike, si, Ọ bu ndi di uku di kwa ogologo kari ayi, na obodo uku ewusiri ike rue elu-igwe; ọzọ kwa, umu Anakim ka ayi huru n'ebe ahu.


ndi di uku, di kwa ọtutu, di kwa ogologo, dika ndi Anak; ma Jehova kpochapuru ha n'iru ha; ha we napu ha ala-ha, bichie n'ọnọdu ha:


Ndia nile bu obodo eji mb͕idi di elu, na ọnu-uzọ-ama, na nkpọrọ, wusi ike; nāgughi obodo nēnweghi mb͕idi, ha bara uba nke-uku.


Ọ dighi ndi Anak fọduru n'ala umu Israel; nání nime Geza, na nime Gat, na n'Ashdod, ka ha fọduru.


Ma ub͕u a, nyem ugwu a, nke Jehova kwuru okwu bayere ya n'ubọchi ahu; n'ihi na i nuru n'ubọchi ahu na ndi Anak nọ n'ebe ahu, na obodo di uku nke ewusiri ike: eleghi anya Jehova gānọyerem, m'gānapu kwa ha ala-ha, dika Jehova kwuru.


Keleb we si n'ebe ahu napu umu-ndikom Anak atọ, bú Sheshai, na Ahiman, na Talmai, umu Anak, ala-ha.


Ha we nye Keleb Hebron, dika Moses kwuru: o we napu umu Anak atọ ala-ha n'ebe ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan