Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 13:17 - Bible Nso

17 Moses we ziga ha iledo ala Kenean, ọ si ha, Rigonu n'uzọ a nime Negeb, rigo-kwa-nu n'ugwu:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Mosis zipụrụ ha ịga ledoo ala Kenan, ọ sịrị, “Gbagoonụ site nʼụzọ Negev gakwanụ nʼala ugwu ugwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 13:17
16 Iomraidhean Croise  

Abram we bulie ije, nēje nēbuli kwa ije n'uzọ Negeb.


Abram we si n'Ijipt rigo, ya onwe-ya, na nwunye-ya, na ihe nile ọ nwere, na Lot tiyere ya, rue Negeb.


Bilie, jegharia n'ala nka n'ogologo-ya na n'obosara-ya; n'ihi na gi ka M'gēnye ya.


O si na Negeb je na nbuli-ije-ya we rue Bet-el, rue ebe ahu ebe ulo-ikwū-ya diri site na nmalite, n'etiti Bet-el na Ai;


Ma ndagwurugwu Sidim bu nání olùlù olùlù nke bitumen; ndi-eze Sọdọm na Gọmọra we b͕alaga, da n'ebe ahu, ndi fọduru we b͕alaga n'ugwu.


we hu ala ahu, ihe ọ bu; na ndi ahu ndi bi na ya, ma ọ bu ndi di ike ka ha bu, ma-ọbu ndi nādighi ike, ma ọ bu madu ole-na-ole ka ha di, ma-ọbu ọtutu madu;


Amalek bi n'ala Negeb; ndi Het na ndi Jebus na ndi-Amorait bi n'ugwu: ndi Kenean bi n'usọ oké osimiri, na n'akuku Jọdan.


Ha we bilie n'isi-ututu, rigorue elu ugwu ahu, si, Le ayi, Le ayi, ayi gārigoru kwa ebe ahu nke Jehova kwuru okwu bayere ya: n'ihi na ayi emehiewo.


Ndi-Amorait, ndi bi n'ugwu ahu, we puta izute unu, ha we chua unu, dika anwu si eme, we zọpia unu nime Sia, rue Họma.


Joshua we tib͕ue ala ahu nile, bú ugwu, na Negeb, na ebe di ala ala, na nkpọrube nile, na eze-ha nile; ọ dighi onye fọduru ọ rapuru: o wezuga ihe nile nēku ume ka ebibie ya, dika Jehova, bú Chineke Israel, nyere iwu.


o we pua rue akuku Ndida nke nrigo Akrabim, gabiga rue Zin, rigo n'akuku Ndida nke Kedesh-banea, gabiga Hezron, rigorue Ada, b͕a buruburu rue Kaka:


Joshua nwa Nun we si na Shitim zipu ndikom abua na nzuzo, bú ndi-nledo, si, Jenu, le ala ahu, na Jeriko. Ha we je, ba n'ulo otù nwayi nākwa iko, aha-ya bu Rehab, ha we dina n'ebe ahu.


Ọ si ya, Nyem ngọzi; n'ihi na ọ bu ala Negeb a ka i nyeworom, gi nyekwam isi miri ufọdu. Keleb we nye ya isi miri di n'elu, na isi miri di n'okpuru.


Jehova nọye-kwa-ra Juda; o we nweta ugwu; ma ọ pughi inapu ndi bi na ndagwurugwu ala-ha, n'ihi na ha nwere ub͕ọ-ala ígwè.


Emesia umu Juda ridara ibuso ndi Kenean agha, bú ndi bi n'ugwu, na nime Negeb, na n'ebe di ala ala.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan