Ọ si ha, Nke ahu bu ihe Jehova kwuworo, si, Idebe-ubọchi-izu-ike, bú ubọchi-izu-ike di nsọ nye Jehova, ka echi bu: ihe unu nēghe, ghenu ya, ihe unu nēsi kwa, sienu ya; ma ihe nile nke fọduru, dọbaranu onwe-unu ya, ka ọ buru ihe-ndebe rue ututu.
Ndi Israel jeghariri, chikọta ya, were nkume-igwe-nri gwe ya, ma-ọbu na ha suru ya n'ikwè, we sie ya n'ite, me ya ka ọ buru ob͕e achicha: idetu ya ire ọ di ka idetu ihe eji manu si esi.
Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist. Onye nēmeri emeri, ya ka M'gēnye ufọdu nime manna ahu nke ezobeworo, M'gēnye kwa ya nkume ọcha, n'elu nkume ahu ka edewo-kwa-ra aha ọhu, nke ọ nādighi onye ọ bula matara ma-ọbughi onye nānata ya.