Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 11:20 - Bible Nso

20 rue otù ọnwa zuru ezù, rue mb͕e o gēsi n'imi-unu puta, ọ we ghọrọ unu ihe-isọ-oyi: n'ihi na unu ajuwo Jehova Nke nọ n'etiti unu, unu we kwa ákwá n'iru Ya, si, N'ìhi gini kwa ka ayi siworo n'Ijipt puta?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Kama unu ga-eri ya otu ọnwa zuru ezu, ruo mgbe ọ ga-esi unu nʼimi sọpụta, ghọrọ unu ihe ịsọ oyi. Nʼihi na unu ajụla Onyenwe anyị, onye nọ nʼetiti unu, kwaa akwa nʼihu ya, sị, “Gịnị mere anyị ji site nʼala Ijipt pụta?” ’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 11:20
21 Iomraidhean Croise  

Ma ub͕u a mma-agha agaghi-ewezuga onwe-ya n'ulo-gi rue mb͕e ebighi-ebi; n'ihi na i lelìwom, we kuru nwunye Uraia onye-Het ka ọ ghọrọ gi nwunye.


O we nye ha ihe ha riọrọ; Ma O zitere aru-ọtita na nkpuru-obi-ha.


O rue, n'anyasi, na nnunu quail rigotara, kpuchie ebe ọmuma-ulo-ikwū-ha: n'ututu igirigi we dikwasi n'ala buru-buru ọmuma-ulo-ikwū.


umu Israel we si ha, Ọ gādi ayi nọ̄ nma ma asi na ayi nwururi n'aka Jehova n'ala Ijipt, mb͕e ayi nọduru n'akuku ite anu, mb͕e ayi rijuru nri afọ; n'ihi na unu emewo ka ayi puta ba n'ọzara nka, iwere agu me ka nkpọkọta nka nile nwua.


Moses we si, Nka gābu mb͕e Jehova gēnye unu anu n'anyasi ka unu rie, mb͕e Ọ gēnye kwa unu nri n'ututu ka unu riju afọ; ebe Jehova nānu ntamu unu onwe-unu nātamu megide Ya: ma àyi onwe-ayi bu gini? ha abughi imegide ayi, bú ntamu unu nātamu, kama imegide Jehova.


Nkupuru-obi nke rijuworo afọ nāzọda manu-aṅu nke si n'ub͕ub͕ọ-manu-aṅu nābusi: Ma ihe nile ọ bula nke nēlu ilu nātọ nkpuru-obi agu nāgu utọ.


Nwa nāsọpuru nna-ya, orù nāsọpuru kwa onye-nwe-ya: ọ buru kwa na nna ka M'bu, òle ebe nsọpurum di? ọ buru kwa na onye-nwe-madu ka M'bu, òle ebe egwum di? ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri unu, unu ndi-nchu-àjà, ndi nēlelì aham. Ma unu asiwo, Nìme gini ka ayi lelìworo aha-Gi?


Òle ebe m'gēsi nwe anu inye ndi nka nile? n'ihi na ha nākwasom ákwá, si, Nye ayi anu, ka ayi we rie.


Ọ bughi otù ubọchi ka unu gēri anu, ọ bughi ubọchi abua, ọ bughi ubọchi ise, ọ bughi ubọchi iri, ọ bughi orú ubọchi;


Moses we si, Orú nnù ndikom ọgu uzọ atọ na orú nnù uzọ iri-na-ise ndi ji ukwu eje ka ndi ahu di, bú ndi mu onwem nọ n'etiti ha: ma Gi onwe-gi asiwo, Anu ka M'gēnye ha, ka ha we rie otù ọnwa zuru ezù.


Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka Jehova nēme ka ayi ba n'ala nka, ida site na mma-agha? Ndinyom-ayi na umu-ntakiri-ayi gāghọ ihe-nluta-n'agha: ọ̀ gaghi-adi ayi nma ilaghachi n'Ijipt?


Ha we sirita onwe-ha, Ka ayi me otù onye onye-isi, ka ayi laghachi kwa n'Ijipt.


ọ̀ bu ihe ntà na i mewo ka ayi si n'ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya rigoputa, ime ka ayi nwua n'ọzara nka, ma i ghaghi ime kwa onwe-gi onye-isi-ayi?


Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu meworo nkpọkọta Jehova ka ọ ba n'ọzara nka, inwu n'ebe ahu, ayi onwe-ayi na anu-ulo-ayi?


Ndi Israel we kwue okwu megide Chineke, megide kwa Moses, si, N'ìhi gini ka unu meworo ka ayi si n'Ijipt rigota inwu n'ọzara nka? n'ihi na achicha adighi, miri adighi kwa; ike agwusiwo kwa nkpuru-obi-ayi n'achicha nka di nfé.


Lenu, ndi-nlelì-anya, ka o ju kwa unu anya, ka ekpochapu kwa unu; N'ihi na ọlu ka Mu Onwem nālu n'ubọchi-unu, Ọlu unu nāgaghi-ekwe ma-ọli ọ buru na onye ọ bula kọrọ unu akukọ-ya.


Ya mere onye nāju, ọ bughi madu ka ọ nāju, kama ọ bu Chineke, Onye nēnye Mọ Nsọ Ya ka Ọ ba nime unu.


Joshua we si ndi Israel nile, Le, nkume a gābu àmà megide ayi; n'ihi na ọ nuwo okwu-ọnu nile nke Jehova nke Ọ gwara ayi: ọ gābu kwa àmà megide unu, ka unu we ghara igọnari Chineke-unu.


ma unu onwe-unu ajuwo Chineke-unu ta, Onye Ya onwe-ya nāzọputa unu n'aka ihe ọjọ unu nile na nkpab͕u nile unu; unu we si Ya, É-è, kama mere ayi eze. Ma ub͕u a guzonu onwe-unu n'iru Jehova n'ebo nile unu, na n'usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri unu.


N'ihi nka, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova, bú Chineke Israel, puta, Ọ bu ezie na M'siri na ulo-gi na ulo nna-gi gējeghari n'irum rue mb͕e ebighi-ebi: ma ub͕u a, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, Ya burum ihe-árú; n'ihi na ndi nāsọpurum ka M'gāsọpuru, ma agākpọ ha ihe efu, bú ndi nēlelìm.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan