Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 10:10 - Bible Nso

10 Ọ bu kwa n'ubọchi ọṅu-unu, na na mb͕e nile unu akara àkà, na nime nmalite ọnwa nile unu, ka unu gēwere opì abua ahu fùa n'elu àjà-nsure-ọku nile unu, na n'elu ihe àjà nke àjà-udo nile unu; ha gābu-kwa-ra unu ihe-ncheta n'iru Chineke-unu; Mu onwem bu Jehova, Chineke-unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Unu ga-egbukwa opi ndị a nʼoge aṅụrị, nʼoge mmemme unu a kara aka, na nʼoge mmemme ọnwa ọhụrụ niile. Gbukwaanụ opi mgbe unu na-achụ aja nsure ọkụ unu, na aja udo unu niile. Ka ọ bụrụ ihe a ga-eji na-echeta unu nʼihu Chineke unu. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 10:10
34 Iomraidhean Croise  

Ọ si, Gini mere gi onwe-gi nējekuru ya ta? ọ bughi ọnwa ọhu, ọ bughi kwa ubọchi-izu-ike. Ọ si, Udo.


Shebania, na Joshafat, na Netanel, na Amasai, na Zekaraia, na Benaia, na Elieza, bú ndi-nchu-àjà, nāfù opì n'iru ib͕e Chineke: Obed-edom na Jehia bu ndi-ọnu-uzọ-ama diri ib͕e ahu.


Israel nile we were iti-nkpu, were kwa olu opì-ike, chiri kwa opì, na ájà, nēbugota ibe ọb͕ub͕a-ndu Jehova, nēwere une na ubọ-akwara me ka anu udà-ha.


ha na Himan na Jedutun, ndi chiri opì na ájà inye ndi nēme ka anu udà-ha, chiri kwa ihe abù Chineke: na umu Jedutun, inọ n'ọnu-uzọ-ama.


Ndi Livai we chiri ihe Devid guzo, ndi-nchu-àjà chiri kwa opì.


Nkpọkọta ahu nile nākpọ kwa isi ala, ndi-ọbù-abù nābù kwa, ndi nāfù opì nāfù kwa: anēme ihe a nile rue mb͕e achubìri àjà-nsure-ọku.


Ndi-nchu-àjà nēguzo kwa, dika ihe-ndebe-ha si di; ha na ndi Livai, ndi chiri ihe abù Jehova, nke Devid, bú eze, mere ikele Jehova, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di, mb͕e Devid nēto Chineke site n'aka-ha: ndi-nchu-àjà nāfù kwa opì n'iru ha; Israel nile nēguzo kwa.


Ma mb͕e ndi nēwu ulo tọrọ ntọ-ala ulo no, uku Jehova, ha we guzo ndi-nchu-àjà n'uwe-ha chiri opì, na ndi Livai, bú umu Esaf, chiri ájà, ito Jehova, dika ukpuru Devid, bú eze Israel, si di.


na ufọdu nime umu nke ndi-nchu-àjà, ndi chiri opì: na Zekarai nwa Jonatan, nwa Shemaia, nwa Matanaia, nwa Maikaia, nwa Zakua, nwa Esaf;


Werenu ọfufù opì-ike to Ya: Chirinu une na ubọ-akwara to Ya.


Fùanu opì-ike n'ọnwa ọhu, N'ọnwa ndọzu, n'ubọchi ememe-ayi.


N'ihi na ukpuru enyere Israel ka ọ bu, Ọ bu ikpe Chineke nke Jekob kpere.


Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi ahu bu nke mara olu iti-nkpu ahu: Jehova, n'ìhè nke iru-Gi ka ha nēje ije.


Eron gēbu kwa aha umu Israel n'ihe-ib͕ochi-obi nke ikpé n'elu obi-ya, mb͕e ọ nābà n'ebe nsọ ahu, ibu ihe-ncheta n'iru Jehova mb͕e dum.


I gānara kwa ego nkpuchi-nmehie ahu n'aka umu Israel, nye ya n'òfùfè nke ulo-ikwū nzute; ka ọ we buru umu Israel ihe-ncheta n'iru Jehova, ikpuchiri nkpuru-obi-unu nmehie.


Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na agāfù opì-ike uku; ha gābia kwa, bú ndi nāla n'iyì n'ala Asiria, na ndi achusara achusa n'ala Ijipt; ha gākpọkwa isi ala nye Jehova n'ugwu nsọ ahu nime Jerusalem.


Gwa umu Israel okwu, si, N'ọnwa nke-asa, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, idebe-ubọchi-izu-ike gādiri unu, ncheta nke uda-opì nādasi ike, nkpọkọta nsọ.


Ọzọ, mb͕e unu nēbu agha n'ala-unu megide onye-nkpab͕u nākpab͕u unu, unu gēwere opì me ka ha dasie uda ike; agēcheta kwa unu n'iru Jehova, bú Chineke-unu, agāzọputa kwa unu n'aka ndi-iro-unu.


Ọzọ, na nmalite ọnwa-unu nile unu gēweta nso àjà-nsure-ọku isurere Jehova; umu-oke-ehi abua, na otù ebulu, na umu-aturu asa nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè;


Ọzọ, n'ọnwa nke-asa, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, nkpọkọta nsọ gādiri unu; ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje: ubọchi uda-opì ka ọ gāburu unu.


Biakutenum, unu nile ndi nādọb͕u onwe-unu n'ọlu, ndi ebowo-kwa-ra ibu di arọ́, Mu onwem gēme kwa ka unu zuru ike.


O we legide ya anya, tu kwa egwu, si, Ọ̀ bu gini, Onye-nwe-ayi? Ọ si ya, Ekpere-gi nile na ọlu ebere gi nile rigoro ibu ihe-ncheta n'iru Chineke.


n'oge dikarisiri ntà, n'otù ntabi-anya, mb͕e agāfù opì ikpe-azu: n'ihi na agāfù opì, agēme kwa ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie nāpughi ire uré, agēnwo kwa ayi onwe-ayi.


N'ihi na Onye-nwe-ayi onwe-ya gēwere oké ikpọ-òkù, were olu isi-mọ-ozi, were kwa opì nke Chineke, si n'elu-igwe ridata: ndi nwuru nime Kraist gēbu kwa uzọ si n'ọnwu bilie:


Ya mere werenu okwu ndia nākasirita ibe-unu obi.


unu gāsi kwa ha, N'ihi na ebipuru miri Jọdan n'iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova; mb͕e ọ gabigara Jọdan, ebipuru miri Jọdan: nkume ndia gābu-kwa-ra umu Israel ihe-ncheta rue mb͕e ebighi-ebi.


Ndi-nchu-aja asa gēbu kwa opì-ike oké uda asa n'iru ib͕e ahu: ma n'ubọchi nke-asa unu gāb͕a obodo ahu buruburu ub͕ù asa, ndi-nchu-aja gāfù kwa opì-ike asa ahu.


Mọ Nsọ na nwanyi ahu anālu ọhu nāsi kwa, Bia. Onye nānu, ya si kwa, Bia. Onye akpiri nākpọ kwa nku, ya bia: onye nāchọ, ya nara miri nke ndu ahu n'efù.


Devid we si Jonatan, Le, ọnwa ọhu gāpu echi, mu onwem aghaghi kwa iso eze nọdu n'iri ihe: ma zilagam, ka m'we zo onwem n'ọhia rue anyasi nwa-nne-echi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan