Ọnụọgụgụ 1:53 - Bible Nso53 Ma ndi Livai gāma ulo-ikwū-ha buruburu ebe-obibi ihe-àmà ahu, ka iwe we ghara idi n'aru nzukọ umu Israel: ndi Livai gēdebe kwa ihe-ndebe nke ebe-obibi ihe-àmà ahu. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a53 Ndị Livayị ga-ama ụlọ ikwu ha gburugburu ụlọ nzute Ihe Ama ahụ, ka iwe ọkụ m ghara ịbịakwasị nʼahụ nzukọ ụmụ Izrel. Ọ bụ ọrụ ndị Livayị ilekọta ụlọ nzute Ihe Ama ahụ.” Faic an caibideil |
ha nēsure-kwa-ra Jehova àjà-nsure-ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ kwa-ututu kwa-anyasi, ya na ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda di iche iche me: achicha edoro n'usoro di kwa n'elu table ahu di ọcha: ihe-idọba-oriọna nke ọla-edo na oriọna-ya nile di kwa, inwu enwu kwa-anyasi: n'ihi na ayi onwe-ayi nēdebe ihe-ndebe Jehova, bú Chineke-ayi; ma unu onwe-unu arapuwo Ya.