Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 1:51 - Bible Nso

51 Ma na nbuli-ije nke ebe-obibi ahu, ndi Livai gēweda ya: ọzọ, n'ọmuma nke ebe-obibi ahu, ndi Livai gēguzo ya ọtọ: ma onye ala ọzọ nke nābiaru nso, agēme ka ọ nwua.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

51 Mgbe ọbụla kwa a ga-ebugharị ya maka njem, ọ bụ ọrụ ha iweda ya. Mgbe ọbụla a ga-eguzo ya ọtọ, ọ bụkwa ọrụ ndị Livayị iguzobe ya ọtọ. Onye ọbụla ọzọ ga-abịa nso ka a ga-egbu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 1:51
15 Iomraidhean Croise  

Iwe Jehova we di ọku megide Uza; Chineke we tib͕ue ya n'ebe ahu n'ihi nmehie-ya; o we nwua n'ebe ahu n'akuku ib͕e Chineke.


O rue n'arọ nke-abua, n'ọnwa nke-abua, n'ubọchi nke-orú n'ọnwa ahu, na igwe-oji ahu siri n'elu ebe-obibi nke ihe-àmà ahu rigo.


iburu umu Israel ihe-ncheta, ka nwoke ala ọzọ onye nēsiteghi na nkpuru Eron, we ghara ibia nso isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru Jehova; ka ọ ghara idi ka Kora, di kwa ka nzukọ-ya: dika Jehova gwara ya okwu n'aka Moses.


Onye ọ bula nke nābiaru nso, nke nābiaru nso ebe-obibi Jehova, gānwu: ọ̀ bu na ayi agwusiwo n'ikubì ekubì?


O gēru kwa, na nwoke ahu nke M'gārọputa, nkpa-n'aka-ya gāma ifuru: M'gēme kwa ka ntamu nile nke umu Israel si n'arum bìe, bú nke ha onwe-ha nātamu megide unu.


Ma umu Israel agaghi-abiaru nso ulo-ikwū nzute ahu ọzọ ibū nmehie, inwu anwu.


Ha gēdebe kwa ihe-ndebe-gi, na ihe-ndebe nke Ulo-ikwūm nile: nání na ha agaghi-abiaru nso ihe nile nke ebe nsọm, ha agaghi-abiaru kwa nso ebe-ichu-àjàm, ka ha we ghara inwu, ma ha, ma unu.


Ha gārapara kwa n'aru-gi, debe kwa ihe-ndebe nke ulo-ikwū nzute, nke diri òfùfè nile nke Ulo-ikwū ahu: ma onye ala ọzọ agaghi-abiaru nso unu.


Ma gi onwe-gi na umu-gi ndikom tiyere gi gēdebe ọlu-nchu-àjà-unu bayere ihe nile nke ebe-ichu-àjàm, baye-kwa-ra ihe di nime ákwà-nb͕ochi; unu gēfè kwa: dika òfùfè nke onyinye ka M'nēnye unu ọlu-nchu-àjà-unu: ma onye ala ọzọ nke nābiaru nso, agēme ka ọ nwua.


I gēwere kwa Eron na umu-ya ndikom ka ha buru ndi-nlekọta, ha gēdebe kwa ọlu-nchu-àjà-ha: ma onye ala ọzọ nke nābiaru nso, agēme ka ọ nwua.


Ndi nāma ulo-ikwū-ha n'iru ebe obibi ahu chere iru n'Iru-anyanwu, n'iru ulo-ikwū nzute chere iru n'ọwuwa-anyanwu, bu Moses, na Eron na umu-ya ndikom, nēdebe ihe-ndebe nke ebe nsọ ahu, bú ihe-ndebe nke umu Israel; onye ala ọzọ nke nābiaru nso, agēme ka ọ nwua.


O we tib͕ue ufọdu nime ndikom Bet-shemesh, n'ihi na ha lere anya nime ib͕e Jehova, O we tib͕ue n'etiti ndi Israel ọgu ndikom atọ na iri, orú nnù ndikom uzọ isi na nnù ise: ndi Israel we rue újú, n'ihi na Jehova tib͕uru ntib͕u uku n'etiti ndi Israel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan