Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 1:50 - Bible Nso

50 ma gi onwe-gi me ndi Livai ka ha buru ndi nēlekọta ebe-obibi ihe-àmà, ndi nēlekọta kwa lhe-ya nile, ndi nēlekọta kwa ihe nile diri ya: ha onwe-ha ganēbu ebe-obibi ahu, na ihe-ya nile: ha onwe-ha gēje-kwa-ra ya ozi, ọ bu kwa buruburu ebe-obibi ahu ka ha gāma ulo-ikwū-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

50 Kama, ị ga-ahọpụta ndị Livayị ka ha bụrụ ndị nlekọta ụlọ nzute Ihe Ama, na ngwongwo niile, na ihe niile dị nye ya. Ọ bụ ha ga-ebu ụlọ nzute ahụ na ngwongwo ya niile: ha ga na-elekọta ihe banyere ya, ọ bụkwa gburugburu ya ka ha ga-ama ụlọ ikwu ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 1:50
30 Iomraidhean Croise  

Eze we kpọ Jehoiada, bú onye-isi, si ya, Gini mere i jughi ndi Livai ka ha si na Juda, si kwa na Jerusalem, webata ùtú nke Moses, bú orù Jehova, na nke nkpọkọta nke Israel, nke diri ulo-ikwū ihe-àmà?


Edewo ndi-Livai n'akwukwọ n'ubọchi Elaiashib na Joiada na Johanan na Jadua ibu ndi-isi ulo nke ndi bu nna: ndi-nchu-àjà kwa, n'ọbubu-eze Daraiọs, bú onye Peasia.


Israel nile n'ubọchi Zerubabel, na n'ubọchi Nehemaia, nēnye kwa òkè nke ndi-ọbù-abù na ndi-ọnu-uzọ-ama, ihe nke ubọchi n'ubọchi-ya: ha nēdo-kwa-ra ndi Livai ihe nsọ; ndi Livai nēdo-kwa-ra umu Eron ihe nsọ.


Ndi Livai kwa: Jeshua, na Binui, na Kadmiel, na Sherebia, na Juda, na Matanaia, bú onye-isi usu ndi nēkele ekele, ya onwe-ya na umu-nne-ya.


M'we si ndi Livai ka ha nēme onwe-ha ka ha di ọcha, ka ha nābia kwa nēche ọnu-uzọ-ama nile, ido ubọchi-izu-ike nsọ. Chinekem, cheta-kwa-ram ihe a, me-kwa-ram ebere, dika, iba-uba nke ebere-Gi si di.


ọ we doziere ya ime-ulo uku, ma n'ebe ahu ka ha nētiye na mb͕e gara aga onyinye-inata-iru-ọma, na frankincense, na ihe ulo Chineke nile, na otù uzọ n'uzọ iri nke ọka na manya-vine ọhu na manu, bú ihe enyere n'iwu nke ndi Livai na ndi-ọbù-abù na ndi-ọnu-uzọ-ama; na àjà-nbuli nke ndi-nchu-aja.


Ebe ebo nile rigoworo, bú ebo nile nke Ja, Iburu Israel ihe-àmà, Ikele aha Jehova.


Mb͕e Ọ kpayesiri Moses uka n'ugwu Sainai, O we nye ya mbadamba nkume abua nke ihe-àmà ahu, bú mbadamba nkume, nke ewere nkpisi-aka Chineke de ihe n'elu ha.


Ndia bu ngukọta ihe ebe-obibi ahu, bú ebe-obibi nke ihe-àmà ahu, dika agukọtara ha, n'okwu-ọnu Moses, ọ bu òfùfè nke ndi Livai, site n'aka Itama, bú nwa Eron onye-nchu-àjà.


Ma ndi Livai gāma ulo-ikwū-ha buruburu ebe-obibi ihe-àmà ahu, ka iwe we ghara idi n'aru nzukọ umu Israel: ndi Livai gēdebe kwa ihe-ndebe nke ebe-obibi ihe-àmà ahu.


Ndi Kohat we bulie ije, nēbu ebe nsọ ahu: ma ndi ọzọ guzoro ebe-obibi ahu ọtọ rue ọbibia-ha.


Moses we do nkpa-n'aka nile n'iru Jehova n'ulo-ikwū nke ihe-àmà.


Unu gēdebe kwa ihe-ndebe nke ebe nsọm, na ihe-ndebe nke ebe-ichu-àjàm: ka iwe we ghara idikwasi umu Israel ọzọ.


Ulo-ikwū nzute gēbuli kwa ije, ya na ọmuma-ulo-ikwū ndi Livai, n'etiti ọmuma-ulo-ikwū nile: dika ha si ama ulo-ikwū-ha, otú a ka ha gēbuli ije, nwoke ọ bula n'akuku-ya, dika ọkọlọtọ nile ha si di.


Moses we welie aka-ya were nkpa-n'aka-ya tie nkume ahu di elu ub͕ò abua: miri riri nne we puta, nzukọ ahu we ṅua, ha na anu-ulo nile ha.


Ma mb͕e Eron na umu-ya ndikom kpuchisiri ebe nsọ ahu, na ihe nile nke ebe nsọ ahu, nime nbuli-ije nke ọmuma-ulo-ikwū; emesia, umu Kohat gābia ibū ya: ma ha agaghi-emetu ebe nsọ ahu aka, ha we ghara inwu. Ihe ndia bu ibu umu Kohat n'ulo-ikwū nzute.


site n'onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n'iru we rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri, onye ọ bula nke nābakuru usu-ndi-agha, ije ozi n'ulo-ikwū nzute.


Ewerewom ndi Livai nye Eron, nye kwa umu-ya ndikom, dika ndi enyere enye, site n'etiti umu Israel, ifè òfùfè nke umu Israel n'ulo-ikwū nzute, na ikpuchiri umu Israel nmehie-ha: ka ihe-otiti we ghara idi n'etiti umu Israel, n'ibiaru-nso nke umu Israel nābiaru ebe nsọm.


Moses, na Eron, na nzukọ nile nke umu Israel, we me ndi Livai otú a: dika ihe nile si di nke Jehova nyere Moses n'iwu bayere ndi Livai, otú a ka umu Israel mere ha.


Emesia ndi Livai we ba ifè òfùfè-ha n'ulo-ikwū nzute n'iru Eron, na n'iru umu-ya ndikom: dika Jehova nyere Moses iwu bayere ndi Livai, otú a ka ha mere ha.


Mb͕e ihe ndia gasiri m'we hu, emeghe-kwa-ra ulo nsọ nke ulo-ikwū nke àmà ahu n'elu-igwe:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan