Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 1:3 - Bible Nso

3 site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha n'Israel, unu gāgukọta ha, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di, gi onwe-gi na Eron.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Gị na Erọn ga-agụkọta ndị ikom Izrel niile gbara iri afọ abụọ maọbụ karịa ọnụ, bụ ndị tozuru ije agha. Unu ga-edo ha nʼusuu, nʼusuu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 1:3
16 Iomraidhean Croise  

Joab we nye eze ọnu-ọgugu nke ngukọta ọ gukọtara ndi Israel: ma orú nnù ndikom ọgu uzọ ise di n'Israel, ndi bu dìnkpà ndi nāmiputa mma-agha; ndikom Juda di kwa orú nnù ndikom ọgu uzọ atọ na uzọ abua na nnù iri.


Umu Reuben, na ndi Gad, na nkera ebo Manase, nime ndi bu dìnkpà, ndikom nēbu ọta na mma-agha, nāzọgide kwa uta ikwe ya, ndi ezíwo-kwa-ra ibu agha, di orú nnù ndikom uzọ ise na nnù iri-na-otù na ọgu iri-na-asatọ, ndi nāpukuru usu-ndi-agha.


Amazaia we chikọta Juda, guzo ha dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, nye ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri, nye kwa ndi-isi usu ọgu ndikom ise, bú Juda na Benjamin nile: o we gukọta ha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, o we hu na ha di orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-asa na nnù iri, bú ndi arọputara arọputa, ndi nāpukuru usu-ndi-agha, ndi nēji ube na ọta.


Unu gēdebe kwa ememe achicha ekoghi-eko; n'ihi na ọ bu nime otù ubọchi a ka M'meworo ka usu nile nke ndi-agha-unu si n'ala Ijipt puta: unu gēdebe kwa ubọchi a rue ọb͕ọ nile unu site n'ukpuru ebighi-ebi.


Onye ọ bula nke nāgabiga n'ebe ndi agukọtaworo nọ, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, ọ gēnye àjà-nbuli nke Jehova.


otù beka otù isi, ya bu nkera shekel, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di, enyere n'isi onye ọ bula nke nāgabiga n'ebe ndi agukọtara agukọta nọ, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, n'isi orú nnù ọgu uzọ atọ na uzọ iri-na-ise, na nnù asatọ, na ọgu iri-na-asa, na iri.


n'ọzara nka ka ozu-unu ga-ada; ndi-unu nile agukọtara agukọta, dika ọnu-ogugu nile unu si di, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, ndi tamuworo ntamu megidem,


Gutanu ọnu-ọgugu nzukọ nile nke umu Israel, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, onye ọ bula nke nāpukuru usu-ndi-agha n'Israel.


Gukọta umu Livai, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, dika ab͕uru nile ha si di; nwoke ọ bula site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru ka i gāgukọta ha.


Ndikom ahu ndi nēsi n'ala Ijipt rigoputa, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, ha agaghi-ahu ala ahu ma-ọli nke M'ṅuru Abraham, ṅu-kwa-ra Aisak, ṅu-kwa-ra Jekob, iyi inye ha; n'ihi na ha esozughm n'azu:


Ndia bu nbuli-ije umu Israel, ndi siri n'ala Ijipt puta, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di, n'aka Moses na Eron.


site n'onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n'iru we rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri, onye ọ bula nke nābakuru usu-ndi-agha, ije ozi n'ulo-ikwū nzute.


Mb͕e nwoke gāluru nwunye ọhu, ọ gaghi-apu ba n'usu-ndi-agha, madu agaghi-agabiga rue ebe ọ nọ bayere ihe ọ bula: onye puru n'òfùfè-ala ka ọ gābu n'ulo-ya otù arọ, ọ gēme kwa ka nwunye-ya nke ọ luruworo ṅuria ọṅu.


M'we nye unu iwu na mb͕e ahu, si, Jehova, bú Chineke-unu, enyewo unu ala nka inweta ya: na njikere-agha ka unu gāgabiga n'iru umu-nne-unu, bú umu Israel, unu ndi-dìnkpà nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan