Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 1:16 - Bible Nso

16 Ndia bu ndi akpọrọ nke nzukọ Israel, ndi-isi ebo nile nke ndi bu nna-ha; ndi-isi nke usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Israel ka ha bu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Ndị a bụ ndị ikom e si nʼọgbakọ ahụ họpụta, ndị bụ ndị ndu ebo dị iche iche nʼIzrel. Ha bụ ndị ndu ebo niile dị nʼIzrel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 1:16
20 Iomraidhean Croise  

Gi onwe-gi gēsi kwa na ndi nka nile leputa ndi-dìnkpà, ndi nātu egwu Chineke, ndi nēkwu ezi-okwu, ndi nākpọ urù nēzighi ezi asì; i gēdo kwa ndi ahu n'isi ha, ibu ndi-isi nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, na ndi-isi ọgu ise ọgu ise, na ndi-isi ọgu abua na iri ọgu abua na iri, na ndi-isi iri iri:


Moses we si n'etiti Israel nile rọputa ndi-dìnkpà, me ha ka ha buru ndi-isi ndi ahu, ndi-isi nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, na ndi-isi ọgu ise ọgu ise, na ndi-isi ọgu abua na iri ọgu abua na iri, na ndi-isi iri iri.


Ma gi onwe-gi, Bet-lehem Efrata, nke di ntà idi n'etiti usu nile nke nnù abua na ọgu iri nke Juda, nime gi ka otù onye gēsi putaram ibu onye nāchi achi n'Israel; onye ọpupu-ya nile sitere na mb͕e ochie, site n'ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga.


Moses na Eron we chiri ndikom ndia nke akpọrọ n'aha n'aha:


Madu ganọye-kwa-ra unu, otù nwoke gādiri otù ebo; nwoke ọ bula, onye-isi ulo nna-ya-hà ka ọ bu.


Ma ọ buru na otù ka ha were fùa, ndi-isi, bú ndi-isi nke usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Israel, gēzukọ kwa n'ebe i nọ.


M'gāridata, kpayere gi uka n'ebe ahu M'gānara kwa ufọdu nime Mọ ahu nke dikwasi gi, tukwasi ha; ha gēso kwa gi bū ibu ndi Israel, ka i we ghara ibū ya, nání gi onwe-gi.


ha we bilie n'iru Moses, ha na ndikom ufọdu ndi sitere n'umu Israel, ọgu ndi isi nzukọ iri-na-abua na iri, ndi akpọrọ ibia na nzute, ndikom amara aha-ha:


Umu-ndikom Eliab; Nemuel, na Detan, na Abairam. Ndia bu Detan ahu na Abairam ahu, ndi akpọrọ nke nzukọ Israel, ndi lusoro Moses, luso kwa Eron, ọ̀gù nime nzukọ Kora, mb͕e ha lusoro Jehova ọ̀gù:


Moses we gwa ndi-isi nke ebo nile nke umu Israel okwu, si, Nka bu ihe nke Jehova nyeworo n'iwu.


na ndi-isi Israel, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, wetara ihe nso; ndi ahu bu ndi-isi ebo nile, ndi ahu bu ndi nēguzo n'isi ndi agukọtara agukọta:


M'we chiri ndi-isi ebo nile unu, ndikom mara ihe, ndi ama-kwa-ra aha-ha, m'we do ha ndi-isi-unu, ndi-isi nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, na ndi-isi ọgu ise ọgu ise, na ndi-isi ọgu abua na iri ọgu abua na iri, na ndi-isi madu iri madu iri, na ndi-odozi-okwu, dika ebo nile unu si di.


Ọ si Ya, Biko, Onye-nwe-ayi, #M'gēji gini zọputa Israel? le, usu nnù ndikom abua na ọgu iri nkem bu nke nēnweghi ike nime Manase, mu onwem bu kwa onye pekasiri npe n'ulo nnam.


Sọl we si ndi-orù-ya ndi nēguzo n'akuku ya, Biko, nurunu, unu ndi Benjamin; ọ̀ bu kwa unu nile ka nwa Jesi gēnye ubi na ubi-vine, ọ̀ bu unu nile ka ọ gēdo ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri na ndi-isi usu ọgu ndikom ise?


Ma hunu, we mara ebe-izo-nzuzo nile ebe o nēzo onwe-ya, unu biaghachikutekwam mb͕e unu dozisiri onwe-unu, m'gēso kwa unu je: o gēru kwa, ọ buru na ọ nọ n'ala nka, na m'gāchọputa ya n'usu nnù ndikom Juda abua na ọgu iri nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan