Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọbadaya 1:5 - Bible Nso

5 Ọ buru na ndi-ori abiakute gi, ọ buru na ndi nāpunara madu ihe abia n'abali, (le otú alaworo gi n'iyì nke-uku!) hà agaghi-ezu ihe gēzuru ha n'ori? ọ buru na ndi nāghọrọ nkpuru-vine abiakute gi, hà agaghi-aghọfọ nkpuru nke fọduru itutukọ?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 “Ọ bụrụ na ndị ohi abịakwute gị, e, ọ bụrụ na ndị na-apụnara mmadụ ihe abịakwute gị nʼetiti abalị, lee, ụdị mbibi na-echere ịdakwasị gị! Ọ bụghị naanị ihe ha chọrọ ka ha ga-ezuru? Ọ bụrụ na ndị na-aghọ mkpụrụ vaịnị abịakwute gị, ọ bụ na ha agaghị ahapụrụ gị mkpụrụ ole na ole?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọbadaya 1:5
13 Iomraidhean Croise  

Israel, eb͕uwo nmá-gi n'elu ebe di elu gi! Ndi-dike esiwo aṅa da!


Le, otú i siworo n'elu-igwe da, gi Lusifa, nwa chi-ọbubọ! le, otú eb͕utuworo gi n'ala, gi onye nēme ka ike gwu mba nile!


Ma nkpuru nke fọduru itutukọ gāfọdu nime ya, dika ntisisi nke osisi olive, nkpuru abua ma-ọbu atọ n'elu ngalaba osisi kachasi elu, anọ ma ọbu ise n'alaka-ya nile, bú nke osisi nāmi nkpuru, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova, bú Chineke Israel, puta.


N'ihi na otú a ka ọ gādi n'etiti uwa n'etiti ndi nile, dika ntisisi nke osisi olive, dika nkpuru nke fọduru itutukọ, mb͕e ọghughọ-nkpuru-vine gwusiworo.


Ọ buru na ndi nāghọrọ nkpuru-vine abiakute gi, hà agaghi-aghọfọ nkpuru nke fọduru itutukọ? ọ buru na ndi-ori abia n'abali, hà agaghi-ebibi nke gēzuru ha?


Le ka esiworo bipu otùtù nke uwa nile, b͕aji kwa ya nke-uku! le ka Babilon siworo ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu nke-uku n'etiti mba nile!


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Ha gātutukọsi ndi Israel fọduru dika esi atutukọ nkpuru-vine fọduru: seghachi aka-gi dika ọghọ-nkpuru-vine n'elu alaka nile.


Le, ka obodo ahu nke ndi-ya di ọtutu si nọdu ala nání ya! Le, ka o siworo ghọ ihe di ka nwanyi di-ya nwuru! Obodo nke riri nne n'etiti mba nile, nke bu isi n'etiti ala nile anāchi achi, Le, ka o siworo ghọ usu ndi nēfè òfùfè.


Gi Timan, ndi-dike-gi gātu ujọ, ka ewe bipu onye ọ bula n'ugwu Isọ site n'ob͕ub͕u.


Ahuhu dirim! n'ihi na Adiwom ka mb͕e ha ghọkọtaworo nkpuru nke mb͕e nghọkọta-nkpuru, dika ntutukọ nkpuru ubi-vine fọduru nke ọghughọ-nkpuru-vine: ọ dighi otù uyọkọ nkpuru-vine fọduru iri; nkpuru-osisi fig nke buru uzọ cha ka nkpuru-obim chọsiworo ike.


Nka bu obodo ahu nke nāṅuri ọṅu-agha, nke nānọ na ntukwasi-obi, nke nāsi n'obi-ya, Mu onwem nọ, ọ dighi kwa otù efu ọzọ di ma ewezuga nání mu onwem: le otú ọ ghọworo ebe tọb͕ọrọ n'efu, ebe-nmakpu diri anu-ọhia! onye ọ bula nke nāgabiga n'akuku ya gāma ọsọ, fegharia aka-ya.


Mb͕e i nāghọrọ nkpuru ubi-vine-gi, atutukọla nkpuru-ya fọduru n'azu gi: ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ka ọ gādiri.


ka ha nēguzo n'ebe di anya n'ihi egwu nke nmekpa-aru-ya, nāsi, Ahuhu, ahuhu, obodo uku ahu, Babilon, bú obodo ahu di ike! n'ihi na n'otù oge hour ka ikpé-gi biara.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan