Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọbadaya 1:19 - Bible Nso

19 Ndi Negeb gēnweta kwa ugwu Isọ; ndi ebe di ala ala gēnweta ndi Filistia: ha gēnweta kwa ọhia Efraim, na ọhia Sameria: Benjamin gēnweta kwa Gilead.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Mgbe ahụ, ndị bi na Negev ga-ebichi nʼugwu ugwu Ịsọ, ndị si na Shefela ga-enwekọta ala ndị Filistia. Ha ga-anọchi ala ubi niile nke ndị Ifrem na nke Sameria. Ndị Benjamin ga-enwetakwa Gilead.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọbadaya 1:19
33 Iomraidhean Croise  

Eze Asiria we me ka madu si na Babilon, si kwa na Kuta, si Kwa n'Ava, si kwa na Hemat na Sefavaim, bia, o me ka ha biri n'obodo nile nke Sameria n'ọnọdu umu Israel: ha we nweta Sameria, biri n'obodo-ya nile.


Chineke Israel we kpọte mọ Pul, bú eze Asiria, na mọ Tilgat-pilnesa, bú eze Asiria, o we me ka ha je biri n'ala ọzọ, bú ndi Reuben, na ndi Gad, na nkera ebo Manase, o we me ka ha biarue Hala, na Haboa, na Hara, na osimiri Gozan, rue ta.


Eze zigara Rehum, bú onye-nwe ikpé, na Shimshai, bú ode-akwukwọ, na ndi-òtù-ha fọduru ndi bi na Sameria, na ndi fọduru n'ofè osimiri, Udo, na ihe ọzọ di otú a.


ha we biarue Zerubabel nso, biaru kwa ndi-isi ulo nke ndi bu nna nso, si ha, Ka ayi so unu wue ulo: n'ihi na ayi nāchọ Chineke-unu, dika unu si achọ; ma ayi onwe-ayi adighi-achu àjà site n'ubọchi Isa-hadon, bú eze Asiria, onye mere ka ayi rigorue ebe a.


N'ihi na Chineke gāzọputa Zaion, wu kwa obodo nile nke Juda; Madu gēbi kwa n'ebe ahu, we nweta ya.


Ubi ka agāzú nēgo, de kwa aha n'akwukwọ-ha, ka kwa ha akàrà, kpọ kwa ndi-àmà, n'ala Benjamin, na n'ebe nile di Jerusalem buruburu, na n'obodo nile nke Juda, na n'obodo nile nke ugwu, na n'obodo nile nke ebe di ala ala, na n'obodo nile nke Negeb: n'ihi na M'gēme ka ndi-ha adọtara n'agha lata; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Nke diri umu Amon. Otú a ka Jehova siri: Ọ̀ dighi umu-ndikom Israel nwere? ọ̀ dighi onye-nnweta ihe-ya o nwere? Gini mere Malkam ji nweta Gad, ndi-ya we biri n'obodo-ya nile?


n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a, Le, M'gaje iseti akam n'aru ndi Filistia, bipu ndi Keret, me ka ndi ọnu-miri oké osimiri fọduru la n'iyì.


Unu gēbi kwa n'ala ahu nke M'nyere nna-unu-hà; unu gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra unu Chineke.


Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke umu Amon, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi; n'ihi na ha ab͕awawo ndinyom Gilead di ime afọ ka ha we me ka ókè-ala-ha sa mbara:


M'gēsi kwa n'Ashdad bipu onye bi ya, si kwa n'Ashkelon bipu onye nējide nkpa-n'aka-eze; M'gēchighari kwa akam imegide Ekron, ndi Filistia ndi fọduru gāla kwa n'iyì; otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri.


ka ha we nweta ndi Edom fọduru, na mba nile ndi akpọkwasiri aham; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, bú Onye nēme nka.


Were nkpa-n'aka-Gi zùa ndi-Gi, bú ìgwè ewu na aturu nke ihe-nketa-Gi, ndi bi iche, n'oké ọhia n'etiti Kamel: ka ha ta nri nime Beshan na Gilead, dika n'ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga.


Nke umu Josef, bú nke umu Efraim, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;


Ókè-ala-ha we buru Jeza, na obodo nile nke Gilead, na nkera ala umu Amon, rue Aroea nke di n'iru Raba;


nkera Gilead, na Ashtarot, na Edrei, bú obodo ala-eze Og nime Beshan, we diri umu Makia nwa Manase, diri nkera umu Makia dika ab͕uru nile ha si di.


Obodo nke di na nsọtu ebo umu Juda nwere n'akuku ókè-ala Edom nime Negeb bu Kabzeel, na Ida, na Jagua;


N'ebe di ala ala, Eshtaol, na Zọra, na Ashna;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan