Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọbadaya 1:15 - Bible Nso

15 N'ihi na ubọchi Jehova di nso n'isi mba nile: dika i meworo, otú a ka agēme gi; nmeso-gi gālaghachi n'isi-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 “Ụbọchị nke Onyenwe anyị dị nso nye mba niile. Dịka i si mee ndị ọzọ, otu ahụ ka a ga-eme gị; ihe i metara ga-adị gị nʼisi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọbadaya 1:15
28 Iomraidhean Croise  

ma mb͕e Esta batara n'iru eze, eze ji akwukwọ si ka èchìchè ọjọ ya, nke o chère megide ndi-Ju, ka o chigharikwasi n'isi-ya; ọ si kwa ka akwuba ya na umu-ya ndikom n'elu osisi.


Gini mere Onye puru ime ihe nile nējighi tukọba mb͕e? Gini mere ndi mara Ya nējighi hu ubọchi-Ya nile?


Gi ada Babilon, nke bu onye anāpunara ihe; Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú onye gākwughachi gi Nmeso-gi nke i mesoworo ayi.


Ajọ omume nile nke aka ya gānwude onye ahu nēmebi iwu, Agēji kwa udọ̀ nile nke nmehie-ya jidesie ya ike.


Otú a ka Jehova kwuru megide ndi-ab͕ata-obi ọjọm nile, ndi nēmetu ihe-nketa ahu aka nke M'meworo ka ndim, bú Israel, keta: le, M'gaje iropu ha n'elu ala-ha, ulo Juda ka M'gēropu kwa n'etiti ha.


N'ihi na otú a ka Jehova siri: Le, ndi anēkpeghi ikpe iṅu n'iko ahu aghaghi iṅu; ma gi onwe-gi, ì gābu kwa onye ahu nke anāmaghi ikpe ma-ọli? I gaghi-abu onye anāmaghi ikpe, n'ihi na i ghaghi iṅu.


Menu ka ndi-ọb͕a-uta nuru izukọ imegide Babilon, bú ndi nile nāzọ uta ukwu ikwe ya; manu ulo-ikwū-unu imegide ya buruburu; ya ghara inwe ndi b͕apuru ab͕apu: kwughachinu ya ugwọ dika ọlu-ya si di; dika ihe nile si di nke o meworo, menu ya otú a: n'ihi na Jehova ka o meworo nganga megide, megide Onye Nsọ nke Israel.


n'ihi na onye nāpunara ya ihe-ya ab͕iakwasiwo obodo ahu, bú Babilon, ejidewo kwa ndi-dike-ya, ab͕ajisiwo uta nile ha: n'ihi na Chineke nke nēmeso madu otú ha si eme ka Jehova bu, Ọ ghaghi ikwughachi.


N'ihi na ubọchi di nso, ọ di nso, bú ubọchi Jehova nwere, ọ bu ubọchi igwe-oji; mb͕e nke mba di iche iche ka ọ gābu.


n'ihi nka, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), M'gēme kwa dika iwe-gi si di, na dika ekworo-gi si di nke i kwoworo site n'asì i kpọrọ ha; Mgēme kwa ka amara Mu onwem n'etiti ha, mb͕e M'gēkpe gi ikpe.


Dika i ṅuriri ọṅu n'isi ihe-nketa nke ulo Israel, n'ihi na ọ tọb͕ọrọ n'efu, otú a ka M'gēme gi: ebe tọb͕ọrọ n'efu ka i gābu, gi ugwu Sia, na Edom nile, ọbuná Edom nile: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.


Ewó, ubọchi ahu! n'ihi na ubọchi Jehova di nso, dika nbibi nke sitere n'aka Onye puru ime ihe nile ka ọ gābia.


Fùanu opì-ike nime Zaion, ti-kwa-nu nkpu agha n'ugwu nsọm; ka ndi nile ndi bi n'ala nka ma jijiji: n'ihi na ubọchi Jehova nābia, n'ihi na ọ di nso;


Jehova emewo kwa ka olu-Ya da n'iru usu-ndi-agha-Ya; n'ihi na ihe bara uba nke-uku ka ọmuma-ulo-ikwū-Ya bu; n'ihi na onye nwere ume ka onye nēme ihe O kwuru bu: n'ihi na ubọchi Jehova di uku di kwa egwu nke-uku; ònye kwa gānagide ya?


Ahuhu diri unu ndi nāchọsi ubọchi Jehova ike! ùrù gini ka ubọchi Jehova gābara unu? ubọchi ahu bu ọchichiri, ọ bughi ìhè.


Ọ̀ bughi ọchichiri ka ubọchi Jehova gābu, nke nābughi ìhè? ọ̀ gaghi-ab͕a kwa oké ọchichiri, nke onwunwu ọ bula nādighi ya?


M'gābọ̀ kwa ọ́bọ̀ n'iwe na n'ọnuma n'aru mba nile ndi nānughi olum.


N'ihi na i kwatawo ọtutu mba, ya ka ndi nile fọduru nime ndi nile di iche iche gākwata gi; n'ihi ọbara madu na ihe-ike emere ala, nke emere obodo na ndi nile bi nime ya.


N'ihi na ikpé unu ji kpe ka agēji kpe unu: ọ bu kwa ihe unu ji tù ihe ka agēji tùru unu.


N'ihi na ọ bu ikpé nke ebere nādighi ya ka agēkpe onye nēmeghi ebere: ebere nānyara ikpé isi.


Adoni-bezek we si, Ọgu eze atọ na iri, ndi ebipuru isi-aka-ha na isi-ukwu-ha, nāchikọta ihe n'okpuru table nkem: dika m'meworo, otú a ka Chineke kwughachiworom. Ha we me ka ọ ba na Jerusalem, ọ nwua n'ebe ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan