Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọbadaya 1:11 - Bible Nso

11 N'ubọchi i guzoro iche na ncherita-iru, n'ubọchi ndi ala ọzọ dọtara usu-ndi-agha-ya n'agha, mb͕e ndi mba ọzọ bata-kwa-ra n'ọnu-uzọ-ama-ya nile, fekwasi Jerusalem nzà, ọbuná gi onwe-gi nọ ka otù nime ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Nʼụbọchị ahụ, ị nọọrọ onwe gị, na-ele ndị ọbịa ka ha na-akwakọrọcha akụnụba ya, sitekwa nʼọnụ ụzọ ama ya gafee fee nza iji kerie Jerusalem. Ị dịkwa ka otu onye nʼime ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọbadaya 1:11
13 Iomraidhean Croise  

Ma ndi ala ahu nke fọduru, bú ndi fọduru n'obodo, na ndi dapuru adapu, bú ndi dapuru jekuru eze Babilon, na ndi fọduru n'etiti igwè madu, ndia ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ha je biri n'ala ọzọ.


Jehova, cheta ubọchi Jerusalem Megide umu Edom; Ndi nāsi, B͕abanu ya ọtọ, b͕abanu ya ọtọ, Rue ntọ-ala di nime ya.


Ọ buru na i hu onye-ori, ihe-ya we tọ gi utọ, Gi na ndi nākwa iko ekèkọwo kwa òkè.


N'ihi na ha ewerewo otù obi b͕arita ìzù; Ọ bu imegide Gi ka ha nāb͕a ndu:


Ulo-ikwū nile nke Edom na ndi Ishmael; Moab na ndi Haga;


N'ihi na i siwo, Mba abua ndia na ala abua ndia gābu nkem, ayi gēnweta kwa ya; ma Jehova nọrọ n'ebe ahu:


Ọ bu kwa ndim ka ha fetaworo na nzà: ha we nye nwa-okoro iji b͕anwe nwanyi nākwa iko, nwa-mb͕ọ ka ha re-kwa-ra n'ihi manya-vine, ka ha we ṅua.


Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Geza, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na ha mere ka otù ndi je biri n'ala ọzọ, ha nile, imechibido ha nye n'aka Edom:


Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Taia, e, n'ihi anọ ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na ha mechibidoro otù ndi emere ka ha nile je biri n'ala ọzọ nye n'aka Edom, ha echetaghi kwa ọb͕ub͕a-ndu nke umu-nne:


Ọbuná obodo ahu ka emere ka ọ je biri n'ala ọzọ, ọ lara na ndọta-n'agha: atupia-kwa-ra umu-ya nāṅu ara n'isi èzí nile: ọ bu kwa ndi di nsọpuru ya ka ha fekwasiri nzà, eke-kwa-ra ndi uku ya nkpọrọ.


Nka ka ha gēnwe n'ihi npako-ha, n'ihi na ha atawo ndi Jehova nke usu nile nke ndi-agha uta, me onwe-ha uku imegide ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan