Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehum 2:7 - Bible Nso

7 Ekpughewo kwa Huzab, me ka ọ rigopu, ndi-orù-ya ndinyom nākwa kwa ákwá dika olu nduru, nēti obi-ha aka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 E nyela ya ka ọ bụrụ iwu na obodo a aghaghị ịbụ obodo a dọtara nʼagha. Ndị ohu ha ndị inyom so ha nʼazụ na-akwa akwa dịka nduru, na-etikwa aka nʼobi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehum 2:7
9 Iomraidhean Croise  

N'ihi ara nile ka ha ganēti aka n'obi, n'ihi ubi nile anāchọsi ike, n'ihi osisi vine nāmi nkpuru,


Dika eleke ma-ọbu ub͕ala, otú a ka m'nēbe ebe; Anamekwo ákwá dika nduru: anyam abua atalatawo n'ile anya n'elu; Jehova, anēmeb͕um emeb͕u, nọrọm mbe.


Ayi nāb͕ọ uja dika bear, ayi nile, ọ bu kwa dika nduru ka ayi nēkwosi ákwá ike: ayi nēle anya ikpé ziri ezi, ma ọ digh: ayi nēle anya nzọputa, ma ọ di anya n'ebe ayi nọ.


Ma ndi-ha b͕apuru ab͕apu gāb͕apu, nọ n'ugwu nile dika nduru nke ndagwurugwu, ha nile nēkwo ákwá, onye ọ bula n'ajọ omume-ya.


Emeghewo ọnu-uzọ-ama nile nke osimiri nile, ab͕azewo ulo uku ya.


Le, ndi-gi bu ndinyom n'etiti gi; ndi-iro-gi ka emeghepusiworo ọnu-uzọ-ama nile nke ala-gi nye: ọku eripiawo ihe-ntuchi-gi nile.


Mb͕e Pita nọ n'okpuru n'obí, otù nime umu-ab͕oghọ ndi nējere onye-isi-nchu-àjà ozi we bia:


Oké ìgwè ndi-Ju nēso kwa Ya, ya na ìgwè ndinyom ndi nēti aka n'obi nākwa-kwa-ra Ya ákwá.


Ìgwè madu nile ndi zukọrọ n'ihe-nkiri a, mb͕e ha kirisiri ihe nile mere, ha we laghachi nēti aka n'obi-ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan