6 Emeghewo ọnu-uzọ-ama nile nke osimiri nile, ab͕azewo ulo uku ya.
6 Ma e megheela ọnụ ụzọ ama nke osimiri, ụlọeze na-amakwa jijiji.
Ọ nēcheta ndi-ebube-ya: ha su ngọngọ n'ojije-ha, me ngwa ijeru mb͕idi obodo, ma edoziwo ihe-nkpuchi ndi nānọchigide ya n'agha.
Ekpughewo kwa Huzab, me ka ọ rigopu, ndi-orù-ya ndinyom nākwa kwa ákwá dika olu nduru, nēti obi-ha aka.
Le, ndi-gi bu ndinyom n'etiti gi; ndi-iro-gi ka emeghepusiworo ọnu-uzọ-ama nile nke ala-gi nye: ọku eripiawo ihe-ntuchi-gi nile.