Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehum 2:4 - Bible Nso

4 N'èzí nile ka ub͕ọ-ala nile kpọtuworo nkpọtu nke-uku, ha nāb͕aghari iru na azu n'amá nile: ha di ka ọwa nēnwu enwu n'ile ha anya, dika àmùmà ka ha nāb͕a ọsọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Ụgbọ agha na-eme mkpọtụ dị ukwuu nʼezi, ha na-agbagharị ihu na azụ nʼama niile. Ha na-enwu dịka ire ọkụ, na-agbagharịkwa dịka amụma.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehum 2:4
10 Iomraidhean Croise  

Ọ dighi-atu egwu snow, na ọ gēme ulo-ya ihe; N'ihi na ulo-ya nile nēyi uwe uhie.


I siri n'aka ndi-orù-gi ta Onye-nwe-ayi uta, si, Ọtutu ub͕ọ-alam ka mu onwem jiri rigorue ebe di elu nke ugwu nile, rue akuku ime nile nke Lebanon; m'gēb͕utu kwa osisi cedar ya nile toro ogologo, na osisi fir ya nile arọputara arọputa: m'gābà kwa n'ebe di elu nke nsọtu-ya, oké ọhia nke ubi ọma ya.


N'ihi na, le, Jehova gēji ọku bia, ub͕ọ-ala-Ya nile gādi kwa ka oké ifufe; iji ọnuma nyeghachi iwe-Ya, na iji ire ọku nyeghachi ibasi-nba-ike-Ya.


Le, dika igwe-oji ka ọ nārigota, ọ bu kwa dika oké ifufe ka ub͕ọ-ala-ya nile di: inyinya-ya nile di garagara kari ugo. Ahuhu gādiri ayi! n'ihi na ebibiwo ayi.


Rigonu, unu inyinya; kpọtuanu nkpọtu, unu ub͕ọ-ala; ka ndi-dike puta kwa: Kush na Put, ndi nēji ọta; na Ludim, ndi nēji nāzọ kwa uta ukwu ikwe ya.


Ha gābiakwasi kwa gi chiri ihe-agha, na ub͕ọ-ala, na wheel nākpọre akpọre, chiri kwa nkpọkọta nke ndi di iche iche; ọta uku na ọta na okpu-agha ka ha gēji do onwe-ha imegide gi buruburu: M'gēnye kwa ha ikpé n'aka, ha gēkpe kwa gi n'ikpe nile ha.


Site n'ìgwè inyinya-ya ájá-ha gēkpuchi gi: site n'olu ndi-inyinya, na nke wheel nākpọre akpọre, na nke ub͕ọ-ala, mb͕idi-gi nile gēme nkpatu, mb͕e ọ nābata n'ọnu-uzọ-ama-gi nile, dika esi abata n'obodo nke ab͕awara ab͕awa.


N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, M'gaje ime ka Nebukadreza, bú eze Babilon, si n'Ugwu biarue Taia, ọ bu eze nke ndi-eze, ọ gāchiri inyinya, chiri kwa ub͕ọ-ala, chiri kwa ndi-inyinya na nkpọkọta madu na ndi bara uba, bia.


Ma na mb͕e nke ọgwugwu ihe ndia eze Ndida gāmalite isọ ya mpi: eze Ugwu ewe dakwasi ya dika oké ifufe, chiri ub͕ọ-ala, chiri kwa ndi-inyinya, chiri kwa ọtutu ub͕ọ; ọ gābà kwa n'ala-ya nile, rubiga ókè dika miri, gabiga.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan