Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehum 2:12 - Bible Nso

12 Ọdum nādọb͕u anu gēzuru umu-ya, ọ nātọb͕uta-kwa-ra nne-ọdum-ya nile anu, we kpojue ọb͕à-ya nile n'anu-ndọb͕u, kpoju kwa ebe-obibi-ya nile n'anu ọ dọb͕uworo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ọdụm ahụ na-adọgbu anụ na-ezuru ụmụ ya, nke na-anyagburu nne ọdụm anụ, na-ekpoju anụ ọ dọgbutara nʼụlọ ya niile. Ebe obibi ya jupụtara nʼanụ ọ dọgburu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehum 2:12
7 Iomraidhean Croise  

Hushai we si, Gi onwe-gi amawo nna-gi na ndikom-ya, na ndi-dike ka ha bu, ndi nkpuru-obi-ha di ilu ka ha bu kwa, dika bear ab͕abara aka nwa n'ọhia: nna-gi bu kwa nwoke agha, ọ gaghi-esoro kwa ndi-ya nọ ọnọdu abali.


Oyiyi-ya di ka ọdum nke agu idọb͕u anu nāgusi ike, Na dika nwa-ọdum nke nānọdu n'ebe-nzuzo.


Nebukadreza, bú eze Babilon, eripiawom, o kpochapuwom, o mewom ka m'ghọ aria nke ihe nādighi, o lowom dika ogologo anu-miri, o mejuwo afọ-ya n'ihe-utọm nile, ọ chupuwom.


Òle ebe ebe-obibi ọdum di? ebe-ita-nri ka ọ bu-kwa-ra umu-ọdum, ebe ọdum na nne-ọdum na nwa-ọdum jeghariri, ọ dighi kwa onye nēme ka ha ma jijiji.


Le, Mu nēmegide gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), M'gēsure kwa ub͕ọ-ala-ya n'anwuru-ọku, ọ bu kwa umu-ọdum-i ka mma-agha gēripia: M'gēbipu kwa anu-ndọb͕u-gi n'uwa, agaghi-anu kwa olu ndi-ozi-gi ọzọ.


Le, ndi ahu nēbili dika nne-ọdum, Dika ọdum ka ọ nēweli onwe-ya: Ọ gaghi-edina rue mb͕e ọ gēri ihe ọ dọb͕utara, Ṅu kwa ọbara nke ndi eb͕uru eb͕u.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan