Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehum 1:9 - Bible Nso

9 Gini ka unu nēchè megide Jehova? Ya onwe-ya nēme ka ọ gwusia: nkpab͕u agaghi-ebili nke ub͕ò abua.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Kedụ izu ọjọọ unu na-agba megide Onyenwe anyị ọ ga-eweta ihe niile nʼisi njedebe; nsogbu agaghị abịakwa nke ugboro abụọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehum 1:9
17 Iomraidhean Croise  

Ma Amasa elezighi anya na mma-agha nke di n'aka Joab: o we were ya tie ya n'okpuru ọgiriga nke-ise, wusi ngiri-afọ-ya n'ala, ma o tighi kwa ya ọzọ; o we nwua. Joab na Abishai, bú nwa-nne-ya, we chua Sheba nwa Bikri n'azu.


N'ihi na ha setipuru ihe ọjọ megide Gi: Ha chère ihe-nzube nke ha nāpughi ime.


Jehova emebiwo ndum-ọdu mba nile: Ọ siwo èchìchè nile nke ndi di iche iche, É-è.


Ọ dighi amam-ihe di, ọ dighi kwa nghọta di, Ọ dighi kwa ndum-ọdu di, na ncherita-iru Jehova.


Ma ub͕u a, unu aghọla ndi nākwa emò, ka ab͕u-unu we ghara isi ike: n'ihi na ngwusi, nke aka-kwa-ra àkà, ka m'nuworo n'ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, n'elu uwa nile.


i gāsi kwa, Otú a ka Babilon gēmikpu, ghara ibili ọzọ n'ihi ihe ọjọ ahu nke Mu onwem gaje ime ka ọ biakwasi ya: ike ewe gwu ha. Rue ebe a bu okwu Jeremaia.


anu-aru nile, bú madu, ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, amiputawo mma-agham n'ọbọ-ya; ọ gaghi-alaghachi kwa ọzọ.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ihe ọjọ, otù ihe ọjọ; le, ọ biawo.


Ọ bu ezie na Mu onwem adọwo ha aka na nti, me ka ogwe-aka-ha di ike, ma Mu ka ha nēchè ihe ọjọ megide.


Nime gi ka otù onye siri puta, nke nēchè ihe ọjọ megide Jehova, nādu kwa ọdu ihe jọb͕uru onwe-ya.


ebe ayi nēweda ihe anātule n'obi, na ihe nile ọ bula di elu nke eweliri elu imegide ọmuma Chineke, ayi nādọta kwa ihe nile ọ bula anēchèputa n'agha iṅa nti Kraist;


Abishai we si Devid, Chineke emechibidowo onye-iro-gi nye n'aka-gi ta: ma ub͕u a, biko, ka m'were ube tugide ya n'ala otù ub͕ò, m'gaghi-atu kwa ya nke ub͕ò abua.


N'ubọchi ahu M'gēme ka okwu nile M'kwuworo banyere ulo-ya guzosie ike megide Ilai, site na nmalite we rue ọgwugwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan