Nehum 1:3 - Bible Nso3 Jehova adighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ di kwa uku n'ike, ma ọ dighi uzọ ọ bula Ọ gāgu ndi ikpe mara na ha bu ndi ikpe nāmagh: Jehova, n'oké ikuku na n'oké ifufe ka uzọ-Ya di, igwe-oji bu kwa ájá ukwu-Ya abua. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a3 Onyenwe anyị adịghị ewe iwe ọsịịsọ; ma ọ bụ onye ike ya dị ukwuu, Onyenwe anyị agaghị ahapụ onye ikpe mara ka ọ laa na-enweghị ntaramahụhụ. Ụzọ ya dị nʼoke ikuku, na nʼoke ifufe, igwe ojii bụ uzuzu nke ụkwụ ya. Faic an caibideil |
ha we ju inu ihe, ha echetaghi kwa oké ọlu-Gi nile nke I luru n'etiti ha; ha we kwesie olu-ha ike, do onye-isi nime nnupu-isi-ha ilaghachi n'ọbubu-orù-ha: ma Gi onwe-gi bu Chineke nke nb͕aghara nmehie, Onye nēme amara nwe kwa obi-ebere, Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, Onye nāba uba n'ebere, I rapughi kwa ha.
O we kpere Jehova, si, Biko, Jehova, Ǹka abughi okwum, mb͕e m'nānọ n'alam? N'ihi nka ka m'buru uzọ b͕alaga na Tashish: n'ihi na amaram na Gi onwe-gi bu Chineke nke bu onye-amara, onye-obi-ebere, Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ Nke nāba kwa uba n'ebere, Nke nēchèghari kwa uche bayere ihe ọjọ ahu I gēweta.