Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehum 1:15 - Bible Nso

15 Le, n'elu ugwu ka ukwu nke onye n'ezisa ozi ọma di, bú onye nēme ka anuru okwu udo! Me ememe-gi nile, gi Juda, Kwughachi nkwa nile i kwere: n'ihi na onye jọb͕uru onwe-ya agaghi-agabiga kwa nime gi ọzọ; ebipusiwo ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Lee, nʼelu ugwu niile ka ụkwụ onye ahụ na-eweta oziọma dị, bụ onye ahụ na-ekwusa na udo ga-adị! Mee mmemme gị niile gị Juda, mezukwaa nkwa niile i kwere. Nʼihi na ndị ajọ omume agakwaghị ebuso gị agha, nʼihi na a ga-ala ha nʼiyi kpamkpam.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehum 1:15
21 Iomraidhean Croise  

Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya, Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!


Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya, Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!


Abum onye mbu isi Zaion, Le, le ha: M'gēnye kwa Jerusalem onye nēzisa ozi ọma.


Ka ọzara na obodo-ya nile welie olu-ha, obodo ntà nile Kida bi: ka ndi bi na Sela tie nkpu ọṅù, ka ha si n'elu ugwu nile tisie nkpu ike.


Teta, teta, yiri ike-gi dika uwe, gi Zaion; yiri uwe-gi nile mara nma, gi Jerusalem, bú obodo nsọ: n'ihi na onye nēbighi úgwù na onye ruru árú agaghi-abata kwa nime gi ọzọ site n'ub͕u a.


Le, ka ha si ma nma nke-uku n'elu ugwu, bú ukwu nke onye nēzisa ozi ọma, bú onye nēme ka anuru okwu udo, onye nēzisa ozi ọma nke ezi ihe, onye nēme ka anuru okwu nzọputa; onye nāsi Zaion, Chineke-gi bu eze!


Unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Onye bi na Zaion, bú ugwu nsọm: Jerusalem ewe di nsọ, ndi ala ọzọ agaghi-agabiga kwa nime ya ọzọ.


Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e nile akara àkà nke Jehova, nke unu gākpọsa ha, ka ha buru nkpọkọta nsọ, ndia bu mb͕em akara àkà.


Ndia bu mb͕e akara àkà nke Jehova, bú nkpọkọta nsọ, nke unu gākpọsa na mb͕e-ha akara àkà.


Jehova enyewo kwa iwu bayere gi, ka aghara igha kwa nkpuru ọ bula ọzọ nke sitere n'aha-gi: n'ulo chi-gi nile ka M'gēbipu arusi apiri api na arusi awuru awu; M'gēdo ílì-gi; n'ihi na elelìwo gi anya.


Mọ-ozi ahu we si ha, Unu atula egwu; n'ihi na le, anamezì unu ozi ọma nke oké ọṅù nke gādiri ndi Israel nile:


Otuto diri Chineke n'ebe kachasi ihe nile elu, Udo di kwa n'elu uwa n'etiti madu ndi ihe-ha di Ya ezi nma.


Okwu nke O zitere umu Israel, nēzisa ozi ọma nke udo site n'ọnu Jisus Kraist (Onye ahu bu Onye-nwe madu nile)


ma hà gēsi aṅa kwusa, ma ọ buru na ezigaghi ha? dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Le, ka ha si ma nma nke-uku, bú ukwu ndi nēzisa ozi ọma nke ezi ihe!


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan