Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehemaya 9:38 - Bible Nso

38 Ma n'ihi ihe a nile ka ayi onwe-ayi nēme ọb͕ub͕a-ndu kwesiri ntukwasi-obi, ayi nēde kwa ya n'akwukwọ; ndi-isi-ayi na ndi Livai ayi na ndi-nchu-àjà-ayi bu kwa ndi-isi n'ikà ihe ahu akara akàrà.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

38 “Nʼihi ihe ndị a niile, anyị na-ekwe gị nkwa ugbu a na anyị ga-efe gị. Anyị, ndịisi anyị, ndị Livayị na ndị nchụaja, na-etinye aha anyị nʼọgbụgba ndụ a.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehemaya 9:38
10 Iomraidhean Croise  

Eze we guzo n'akuku ogidi, b͕a ndu n'iru Jehova, ijeso Jehova, na iwere obi-ya nile na nkpuru-obi-ya nile debe ihe nile O nyere n'iwu, na ihe-àmà-Ya nile, na ukpuru-Ya nile, ime ka okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu nka nke edeworo n'akwukwọ a guzosie ike: ndi Juda nile we guzo n'ọb͕ub͕a-ndu ahu.


Jehoiada we me ọb͕ub͕a-ndu nke di n'etiti ya na ndi Juda nile na eze, na ha gābu ndi Jehova nwere.


Ub͕u a ọ di n'obim ka ayi na Jehova, bú Chineke Israel, b͕a ndu, ka iwe-Ya nke di ọku we si n'ebe ayi nọ chigharia.


Eze we guzo n'ọnọdu-ya, b͕a ndu n'iru Jehova, ijeso Jehova, na iwere obi-ya nile na nkpuru-obi-ya nile debe ihe nile O nyere n'iwu, na ihe-àmà-Ya nile, na ukpuru-Ya nile, ime okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu nka nke edeworo n'akwukwọ a.


Ma ub͕u a ka ayi na Chineke-ayi b͕a ndu na ayi gēme ka ndinyom ahu nile na umu amuru site na ha pua, dika ndumọdu si di nke Onye-nwe-ayi, na nke ndi nāma jijiji n'ihe nile nke Chineke-ayi nyere n'iwu; dika iwu-Ya si di ka agēme kwa ya.


Ma ndi bu ndi-isi n'ikà ihe nile akara akàrà bu, Nehemaia, bú Tiashata, nwa Hakalaia, na Zedekaia;


ha nēkekọta onwe-ha n'aru umu-nne-ha, bú ndi-ha di ebube, ha nābà kwa n'ọb͕ub͕a-iyi na n'ọṅuṅu-iyi, ijeghari n'iwu Chineke, nke enyere site n'aka Moses, bú orù Chineke, na idebe na ime ihe nile Jehova, bú Onye-nwe-ayi, nyere n'iwu, na ikpé-Ya nile na ukpuru-Ya nile;


Otù onye gāsi, Onye Jehova nwere ka m'bu; onye ọzọ gākpọ onwe-ya n'aha Jekob; onye ọzọ gēdekwasi n'aka-ya, Onye Jehova nwere, ọ gēji kwa aha Israel tue onwe-ya aha.


Ha we ga, mechie ílì ahu si-ike, n'ika akàrà na nkume ahu, ha na òtù ndi-nche ahu yikọrọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan