Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehemaya 9:34 - Bible Nso

34 ndi-eze-ayi, na ndi-isi-ayi, na ndi-nchu-àjà-ayi, na nna-ayi-hà, ha emeghi kwa iwu-Gi, ha aṅaghi kwa nti n'ihe nile I nyere n'iwu na n'àmà-Gi nile, nke I b͕ara megide ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

34 Ndị eze anyị, ndị ndụ anyị na ndị nchụaja na nna nna anyị edebeghị iwu gị; ha aṅaghịkwa ntị nʼihe niile i nyere nʼiwu maọbụ ihe ama gị nke ị dọrọ ha aka na ntị idebe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehemaya 9:34
13 Iomraidhean Croise  

Jehova we b͕ara Israel àmà, b͕a-kwa-ra Juda, site n'aka onye-amuma ọ bula, na onye-ọhu-uzọ ọ bula, si, Sinu n'uzọ ọjọ nile unu laghachi, debe ihe nile M'nyere n'iwu, na ukpurum nile, dika iwu ahu nile si di nke M'nyere nna-unu-hà n'iwu, nke M'zite-kwa-ra unu n'aka ndi-orùm, bú ndi-amuma.


Ha we ju ukpuru-Ya nile, na ọb͕ub͕a-ndu-Ya nke Ya na ndi bu nna-ha b͕ara, na ihe-àmà-Ya nile nke Ọ b͕ara ha; ha we jeso ihe-efu, we ghọ ihe-efu, soro mba ọzọ ndi nọ ha buruburu, ndi Jehova nyere ha iwu bayere ha, ka ha ghara ime dika ha.


N'ihi na nna-ayi-hà mekpuru emekpu, me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, bú Chineke-ayi, ha we rapu Ya, si n'ebe-obibi Jehova chigharia iru-ha, b͕akuta azu-ha.


Ma ub͕u a, Chineke-ayi, àyi gāsi gini mb͕e ihe a gasiri? n'ihi na ayi arapuwo ihe nile I nyere n'iwu,


Ma I nēme ka ọtutu arọ di ogologo n'isi ha, I we were Mọ-Gi b͕a àmà megide ha site n'aka ndi-amuma-Gi: ma ha aṅaghi nti: I we nye ha n'aka ndi di iche iche nke ala ọzọ.


Ma Gi onwe-gi bu onye ezi omume bayere ihe nile nke biakwasiworo ayi; n'ihi na ihe bu ezi-okwu ka I meworo, ma ayi onwe-ayi emebiwo iwu:


Ha onwe-ha efèghi kwa Gi n'ala-eze-ha, na n'ezi ihe-Gi bara uba nke I nyere ha, na n'ala ahu sara mbara nke nwe-kwa-ra ume, nke I tiyere n'iru ha, ha esighi kwa n'omume ọjọ nile ha chigharia.


n'ihi na ha egeghi nti okwum nile, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), nke M'zigara ha ndi-orùm, bú ndi-amuma, igwa ha, nēbili n'isi-ututu nēziga ha; ma unu egeghi nti; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Kama ayi aghaghi ime okwu nile ọ bula nke puworo n'ọnu-ayi, isurere eze-nwanyi nke elu-igwe ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na iwusiri ya àjà-ihe-ọṅuṅu, dika ayi meworo, ayi onwe-ayi, na nna-ayi-ha, na ndi-eze-ayi, na ndi-isi-ayi, n'obodo nile nke Juda, na n'èzí nile nke Jerusalem: ayi we rijue nri afọ, aru adi ayi nma, ọ dighi kwa ihe ọjọ ayi huru.


M'we zitere unu ndi-orùm nile, bú ndi-amuma, nēbili n'isi-ututu nēzite ha, si, Biko, unu emela ihe-árú a nke M'kpọworo asì.


O we nupu isi n'okpuru ikpém nile n'imebi iwu kari mba nile, na n'okpuru ukpurum nile karia ala nile nke di ya buruburu: n'ihi na ikpém nile ka ha juworo, ma ukpurum nile, ha ejegharighi nime ha.


ayi egeghi kwa nti ndi-orù-Gi, bú ndi-amuma, ndi gwara ndi-eze-ayi na ndi-isi-ayi na nna-ayi-hà, gwa kwa ndi nile nke ala-ayi, okwu n'aha-Gi.


O gēru kwa, mb͕e ọtutu ihe ọjọ na ahuhu gāchọta ha, na abù a gāb͕a àmà n'iru ha dika ihe-àmà; n'ihi na agaghi-echezọ ya pua n'ọnu nkpuru-ha: n'ihi na amawom ncheputa-ha nke ndi ahu nēme ta, tutu Mu eme ka ha ba n'ala ahu nke M'ṅuru iyi inye ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan