Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehemaya 9:27 - Bible Nso

27 I we nye ha n'aka ndi nākpab͕u ha, ha we kpab͕ue ha: ma na mb͕e nkpab͕u-ha, ha we tikue Gi, Gi onwe-gi we site n'elu-igwe nu, nye ha ndi-nzọputa dika ọtutu obi-ebere-Gi nile si di, ha we zọputa ha n'aka ndi nākpab͕u ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 Nʼihi nke a, i nyefere ha nʼaka ndị iro ha, ndị kpagburu ha. Ma nʼime mkpagbu ha, ha kpọkuru gị, ị nọkwa nʼeluigwe nụ ekpere ha, sitekwa nʼobi ebere gị zigara ha ndị bịara zọpụta ha, na ndị napụtara ha site nʼaka ndị iro ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehemaya 9:27
19 Iomraidhean Croise  

(Jehova we nye Israel onye-nzọputa, ha we pua n'okpuru aka Siria: umu Israel we biri n'ulo-ikwū-ha, dika na mb͕e gara aga.


Ma Jehova ekwughi na Ọ gēhichapu aha Israel n'okpuru elu-igwe: O we si n'aka Jeroboam nwa Joash zọputa ha.


Jehova we ju nkpuru nile nke Israel, weda ha n'ala, nye ha n'aka ndi nāpunara madu ihe, rue mb͕e O siri n'iru Ya chupu ha.


kama Jehova, bú Chineke-unu, ka unu gātu egwu; Ya onwe-ya gānaputa kwa unu n'aka ndi-iro-unu nile.


O we me ka eze Kaldea rigokwasi ha, o we were mma-agha b͕ue umu-okorọbia-ha n'ulo ebe nsọ ha, o nweghi kwa ọmiko n'aru nwa-okorọbia, ma ọbu n'aru nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, ma-ọbu n'aru okenye, ma-ọbu n'aru onye kara nká: ha nile ka O nyere n'aka-ya.


ma Gi onwe-gi n'ọtutu obi-ebere-Gi arapughi ha n'ọzara: ogidi igwe-oji esighi n'elu ha wezuga onwe-ya n'ehihie, idu ha n'uzọ-ha; ogidi ọku ewezugaghi kwa onwe-ya n'abali, inye ha na uzọ ahu nke ha nēje ije nime ya ìhè.


O we naputa ayi n'aka ndi nākpab͕u ayi. N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.


M'gēche irum imegide unu, agētib͕u kwa unu n'iru ndi-iro-unu: ndi nākpọ unu asì gāzọda unu; unu gāb͕alaga kwa mb͕e ọ nādighi onye nāchu unu.


Ndi-nzọputa gārigota kwa n'ugwu Zaion ikpe ugwu Isọ ikpe; ọ bu kwa Jehova gēnwe ala-eze ahu.


Ma mb͕e Jehova mere ka ndi-ikpe biliere ha, Jehova nọye-kwara-ra onye-ikpe ahu, we zọputa ha n'aka ndi-iro-ha ubọchi nile nke onye-ikpe ahu: n'ihi na Jehova cheghariri uche n'ihi isu-ude-ha n'iru ndi nēmeb͕u ha nākpab͕u kwa ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan