Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehemaya 9:13 - Bible Nso

13 Ọ bu kwa n'elu ugwu Sainai ka I ridara, si n'elu-igwe kpayere ha uka, I we nye ha ikpé ziri ezi na iwu ezi-okwu, na ezi ukpuru na ihe enyere n'iwu:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 “I sitere nʼeluigwe gwa ha okwu, ị rịdatara nʼugwu Saịnaị, ị nyere ha iwu na ntụziaka niile ziri ezi, nyekwa ha ụkpụrụ na ihe niile dị mma nke enyere nʼiwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehemaya 9:13
27 Iomraidhean Croise  

ukpuru nile na ikpé nile na iwu na ihe enyere n'iwu, nke O dere n'akwukwọ nye unu, ndia ka unu gēlezi kwa anya ime ubọchi nile; ma unu atula egwu chi di iche iche ọzọ:


Ezra nka siri na Babilon rigo; ma onye ahu bu ode-akwukwọ nke bu onye-ọ̀kà n'iwu Moses, nke Jehova, bú Chineke Israel, nyere: eze we nye ya ihe nile ọ riọrọ, dika aka Jehova, bú Chineke-ya, si di n'aru ya.


Onye ezi omume ka I bu Jehova, Ọzọ, ihe ziri ezi ka ikpé-Gi nile bu.


Isi ihe nke okwu-Gi bu ezi-okwu; Ọzọ, rue mb͕e ebighi-ebi ka ikpé ọ bula nke ezi omume-Gi di.


Gi onwe-gi ewerewo ihe-iriba-ama-Gi nye ayi n'iwu, Ka ayi we debesie ha ike.


Ọ si ha, Nke ahu bu ihe Jehova kwuworo, si, Idebe-ubọchi-izu-ike, bú ubọchi-izu-ike di nsọ nye Jehova, ka echi bu: ihe unu nēghe, ghenu ya, ihe unu nēsi kwa, sienu ya; ma ihe nile nke fọduru, dọbaranu onwe-unu ya, ka ọ buru ihe-ndebe rue ututu.


nọ na njikere nye ubọchi nke-atọ: n'ihi na ọ bu n'ubọchi nke-atọ ka Jehova gāridata n'anya ndi Israel nile n'elu ugwu Sainai.


Chineke we kwue okwu ndia nile, si,


Jehova we si Moses, Otú a ka i gāsi umu Israel, Unu onwe-unu ahuwo na esiwom n'elu-igwe kpayere unu uka.


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na I gādọwa elu-igwe, ridata, ma asi na ugwu nile gēsi n'iru Gi rùda dika miri;


Mb͕e I mere ihe di egwu nke ayi nēleghi anya ha, I ridatara, ugwu nile siri n'iru-Gi rùda dika miri.


Chineke si na Timan nābia, Onye Nsọ si kwa n'ugwu Peran. Selah Ebube-Ya ekpuchiwo elu-igwe nile, Otuto-Ya juputa-kwa-ra uwa.


Ma ọ buru na ihe m'nāchọghi, ihe ahu ka m'nēme, anamekweye iwu ahu na ọ bu ihe ọma.


Ọ we si, Jehova siri na Sainai bia, Si kwa na Sia walitere ha; O siri n'ugwu Peran nwuputa, O si-kwa-ra na ndi nsọ anāpughi iguta ọnu bia: Ọku di n'aka-nri-Ya, bú iwu enyere ha.


Ọ̀di ndi ọ bula nuru olu Chineke ka o nēsi n'etiti ọku kwue okwu, dika gi onwe-gi nuworo, we di ndu?


N'elu-igwe ka O si me ka i nu olu-Ya, ka O we dọ gi aka na nti: n'elu uwa ka O me-kwa-ra gi ka i hu ọku uku Ya; i we nu okwu-Ya nile site n'etiti ọku ahu.


Òle mba uku di kwa, nke nwere ukpuru na ikpé ziri ezi dika iwu a nile, nke Mu onwem nētiye n'iru unu ta?


Iru na iru ka Jehova kpayere unu uka n'ugwu ahu site n'etiti ọku ahu,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan