Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehemaya 8:7 - Bible Nso

7 Ọzọ, Jeshua, na Bani, na Sherebia, na Jamin, na Akub, na Shabetai, na Hodia, na Maaseia, na Kelita, na Azaraia, na Jozabad, na Hanan, na Pelaia, na ndi Livai, mere ka ndi ahu ghọta iwu ahu: ndi ahu nēguzo kwa n'ebe-nguzo-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Ndị Livayị aha ha bụ Jeshua, Bani, Sherebaya, Jamin, Akub, Shabetai, Hodia, Maaseia, Kelita, Azaraya, Jozabad, Hanan na Pelia, kuziri ndị mmadụ ihe dị nʼIwu mee ka ha ghọta ya dịka ha guzo nʼebe ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehemaya 8:7
27 Iomraidhean Croise  

Eze we chigharia iru-ya, gọzie nkpọkọta nile nke Israel: nkpọkọta nile nke Israel nēguzo kwa.


Hezekaia we gwa ndi Livai nile okwu nābà ha n'obi, bú ndi nwere ezi uche bayere Jehova. Ha we rie ihe ahu akara àkà ubọchi asa ahu, nāchu àjà, bú àjà-udo, nēkele kwa Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha.


Ọ si ndi Livai, bú ndi nēme Israel nile ka ha ghọta ihe, ndi di nsọ n'ebe Jehova nọ, Tiyenu ib͕e nsọ n'ulo ahu nke Solomon nwa Devid, bú eze Israel, wuru; ibu agaghi-adiri unu n'ubu: ub͕u a fènu Jehova, bú Chineke-unu, na ndi-Ya, bú Israel, òfùfè.


Ha we me ka otù nwoke nke nwere uche biakute ayi, dika ezi aka nke Chineke-ayi si di n'aru ayi, o sitere n'umu Mahli, nwa Livai, nwa Israel; na Sherebia na umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri-na-asatọ;


na Hodia, na Hashum, na Bezai;


na Seraia, na Azaraia, na Jeremaia;


na Shabetai, na Jozabad, ndi sitere na ndi-isi ndi Livai, ndi bu ndi-isi nke ije-ozi nke èzí diri ulo Chineke;


Ọzọ, ndi-ọnu-uzọ-ama, bú Akub, na Talmon, na umu-nne-ha, ndi nēche nche n'ọnu-uzọ-ama nile, di ọgu asatọ na iri na abua.


na Azaraia, na Ezra, na Meshulam,


N'iso ya ka ndi Livai, Rehum nwa Bani, mere ka mb͕idi di ike. N'akuku ya ka Hashabaia, bú onye-isi nkera ala di Keila buruburu, mere ka mb͕idi diri buruburu-ala-ya ike.


N'akuku ya ka Eza nwa Jeshua, bú onye-isi Mizpa, mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike, site na ncherita-iru nrigo ulo-ihe-ekike-agha na nkuku mb͕idi.


N'iso ha ka Benjamin na Hashub mere ka mb͕idi di ike na ncherita-iru ulo-ha. N'iso ha ka Azaraia nwa Maaseia nwa Ananaia mere ka mb͕idi di ike n'akuku ulo-ya.


Ndi ahu nile we je iri ihe, na iṅu ihe ọṅuṅu, na iziga òkè, na ime ka oké ọṅù di, n'ihi na ha ghọtara okwu nile nke emere ka ha mara.


Ezra, bú ode-akwukwọ, we guzo n'elu ulo-elu osisi, nke ha mere bayere ihe a; Matitaia, na Shema, na Anaia, na Uraia, na Hilkaia, na Maaseia, we guzo n'akuku ya, n'aka-nri-ya; Pedaia kwa, na Mishael, na Malkija, na Hashum, na Hashbadana, na Zekaraia, na Meshulam, n'aka-ekpe-ya.


Ezra we gọzie Jehova, bú Chineke uku. Ndi ahu nile we za, si, Amen, Amen, n'ichili aka-ha elu: ha we rube isi-ha, kpọ isi ala nye Jehova, kpue iru-ha n'ala.


Ha wee gua n'akwukwọ ahu, bú n'iwu Chineke, guputa ya nke-ọma, we me ka amata isi-ya, ha we ghọta ọgugu-ya.


Ha we bilie n'ebe-nguzo-ha, gua n'akwukwọ iwu Jehova, bú Chineke-ha, otù uzọ n'uzọ anọ nke ubọchi; otù uzọ n'uzọ anọ kwa ka ha nēkwuputa, nākpọ kwa isi ala nye Jehova, bú Chineke-ha.


Jeshua, na Bani, na Kadmiel, na Shebania, na Buni, na Sherebia, na Bani, na Kenani, we bilie n'elu ihe-nrigo ndi Livai, were oké olu tikue Jehova, bú Chineke-ha.


ka unu we zí kwa umu Israel ukpuru nile nke Jehova gwaworo ha site n'aka Moses.


N'ihi na eḅuḅere-ọnu abua nke onye-nchu-àjà gēdebe ihe-ọmuma, ọ bu kwa iwu ka ha gāchọ n'ọnu-ya: n'ihi na onye-ozi nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha ka ọ bu.


Ha gēzí Jekob ikpé-Gi nile, Iwu-Gi ka ha gēzí kwa Israel: Ha gētiye ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'imi-Gi, Tiye kwa àjà-nsuresi-ọku n'elu ebe-ichu-àjà-Gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan