Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehemaya 8:2 - Bible Nso

2 Ezra, bú onye-nchu-àjà, we weta iwu ahu n'iru nkpọkọta Israel, ma ndikom ma ndinyom, ma onye ọ bula nke nāghọta inu ihe, n'ubọchi mbu nke ọnwa nke-asa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ya mere, Ezra, onye nchụaja wepụtara akwụkwọ Iwu ahụ nʼụbọchị mbụ nke ọnwa asaa nʼihu mkpọkọta ahụ bụ nke ndị ikom na ndị inyom na onye ọbụla ga-aghọta ihe mejupụtara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehemaya 8:2
14 Iomraidhean Croise  

ha nēkekọta onwe-ha n'aru umu-nne-ha, bú ndi-ha di ebube, ha nābà kwa n'ọb͕ub͕a-iyi na n'ọṅuṅu-iyi, ijeghari n'iwu Chineke, nke enyere site n'aka Moses, bú orù Chineke, na idebe na ime ihe nile Jehova, bú Onye-nwe-ayi, nyere n'iwu, na ikpé-Ya nile na ukpuru-Ya nile;


N'ubọchi ahu ka ha guru n'akwukwọ Moses na nti ndi Israel; ewe hu ihe edeworo nime ya, bú na onye Amon na onye Moab agaghi-abà na nkpọkọta ndi Chineke rue mb͕e ebighi-ebi;


O we nāgu n'akwukwọ iwu Chineke kwa-ubọchi, site n'ubọchi mbu rue ubọchi ikpe-azu. Ha we me ememe ahu ubọchi asa; ma n'ubọchi nke-asatọ ubọchi-nb͕ochi di, dika ikpé-ya si di.


Nehemaia, nke ya onwe-ya bu Tiashata, na Ezra onye-nchu-àjà, bú ode-akwukwọ, na ndi Livai, bú ndi nēzí ndi ahu ihe, we si ndi ahu nile, Ta, ihe nsọ nke diri Jehova, bú Chineke-unu, ka ọ bu; unu erula újú, akwa-kwa-la ákwá. N'ihi na ndi ahu nile nākwa ákwá, mb͕e ha nuru okwu nile nke iwu ahu.


Ma n'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa nka achikọtara umu Israel n'obubu-ọnu, na n'ákwà-nke, ájá dikwasi kwa ha.


Ònye ka ọ gēzí ihe-ọmuma? ọ̀ bu kwa onye ka ọ gēme ka ọ ghọta ihe anuru? ọ̀ bu ndi emeworo ka ha rapu iṅu miri-ara, ndi anapuru ara?


Gwa umu Israel okwu, si, N'ọnwa nke-asa, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, idebe-ubọchi-izu-ike gādiri unu, ncheta nke uda-opì nādasi ike, nkpọkọta nsọ.


N'ihi na eḅuḅere-ọnu abua nke onye-nchu-àjà gēdebe ihe-ọmuma, ọ bu kwa iwu ka ha gāchọ n'ọnu-ya: n'ihi na onye-ozi nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha ka ọ bu.


Ọzọ, n'ọnwa nke-asa, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, nkpọkọta nsọ gādiri unu; ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje: ubọchi uda-opì ka ọ gāburu unu.


N'ihi na Moses site n'ọb͕ọ mbu nile nwere n'obodo dum ndi nēkwusa ya, ebe anāgu ya n'ulo-nzukọ nile ubọchi-izu-ike dum.


Ọ gēru kwa, mb͕e ọ nānọkwasi n'oche-eze nke ala-eze-ya, na ọ gēdeputara onwe-ya iwu a n'akwukwọ, site n'akwokwọ ahu nke di n'iru ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai:


Ọ dighi okwu ọ bula n'ihe nile nke Moses nyere n'iwu nke Joshua nāgughi n'iru nkpọkọta nile nke Israel, na ndinyom, na umu-ntakiri, na ndi-ọbìa ndi nēje ije n'etiti ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan