Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehemaya 8:17 - Bible Nso

17 Nkpọkọta ahu nile nke ndi nālata site na ndọta-n'agha ahu mere ulo-ntu, we nọdu n'ulo-ntu-ha: n'ihi na umu Israel emeghi otú a site n'ubọchi Jeshua nwa Nun rue ubọchi ahu. Oké ọṅù di uku we di.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Ndị ahụ niile si na ndọta nʼagha lọta wuuru onwe ha ụlọ ikwu biri nʼime ya ụbọchị asaa ahụ niile e mere mmemme ahụ. Oke ọṅụ jupụtara obi mmadụ niile, nʼihi na site nʼoge Joshua nwa Nun ruo nʼoge a, o nwebeghị mgbe ụmụ Izrel mere mmemme a nʼụzọ dị otu a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehemaya 8:17
13 Iomraidhean Croise  

ha we were ọṅù uku rie ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu n'iru Jehova ubọchi ahu. Ha we me Solomon nwa Devid eze nke ub͕ò abua, te ya manu nye Jehova ibu onye-ndú, ha te-kwa-ra Zedok manu ibu onye-nchu-aja.


Ọṅù uku we di na Jerusalem: n'ihi na site n'ubọchi Solomon nwa Devid, bú eze Israel, ihe dika nka adighi nime Jerusalem.


Emeghi kwa ememe ngabiga dika nka n'Israel site n'ubọchi Samuel, bú onye-amuma; ọ dighi kwa eze Israel ọ bula mere ememe ngabiga dika ememe ngabiga ahu nke Josaia mere, ya na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na Juda na Israel nile ahuru n'ebe ahu, na ndi bi na Jerusalem.


ọbuná dika ihe ubọchi si di n'ubọchi-ya, n'isure àjà-nsure-ọku dika ihe Moses nyere n'iwu si di, n'ubọchi-izu-ike nile, na n'ọnwa ọhu nile, na na mb͕e nile akara àkà, ub͕ò atọ n'arọ, bú n'ememe achicha ekoghi-eko, na n'ememe nke izù asa nke ubọchi asa, na n'ememe ulo-ntu.


Ha we me ememe ulo-ntu, dika edeworo ya, ha we chua àjà-nsure-ọku nke ubọchi n'ubọchi-ha n'ọnu-ọgugu, dika ikpé si di, bú ihe nke ubọchi n'ubọchi-ya;


Okwu ahu we ghọ anu-aru, bú madu, O we biri n'etiti ayi, (ayi kiri-kwa-ra otuto-Ya, bú otuto dika otù nwa-nwoke amuru nání ya nānata n'aka nna-ya), O juputara n'amara na ezi-okwu.


Ubọchi asa ka i gēmere Jehova, bú Chineke-gi, ememe n'ebe ahu nke Jehova gārọputa: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, gāgọzi gi n'ihe-ọmume-gi nile, na n'omume nile nke aka-gi, i gābu kwa onye nāṅuri nání ọṅu.


Ndia nile nwuru n'uzọ okwukwe, ebe ha anataghi nkwa ahu, kama ha huru ha-ri, si kwa n'ebe di anya kele ha, we kwuputa na ha bu ndi-ọbìa na ndi nọ dika ọbìa n'elu uwa.


Okwukwe ka o ji biri dika ọbìa n'ala nke ekwere ya-ri na nkwa, dika ala nābughi nke aka ya, ebe o biri n'ulo-ikwū, ya na Aisak na Jekob, ndi soro ya nēketakọ otù nkwa ahu:


N'ihi na asi na Joshua mereri ka ha zuru ike, Ọ gaghi-adi nēkwu okwu bayere ubọchi ọzọ mb͕e ihe ndia gasiri.


O rue, mb͕e ọnwu Moses, bú orù Jehova, gasiri, na Jehova gwara Joshua nwa Nun, bú onye nējere Moses ozi, okwu, si,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan