Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehemaya 7:6 - Bible Nso

6 Ndia bu umu ala ahu anāchi achi, ndi nārigo, bú ndi sitere na ndọta-n'agha ahu nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ndi Nebukadneza, bú eze Babilon, mere ka ha je biri n'ala ọzọ, ha we lata na Jerusalem, lata kwa na Juda, nwoke ọ bula n'obodo-ya;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Ndị a bụ ndị obodo niile a na-achị achị, bụ ndị sitere na ndọta nʼagha nke Nebukadneza, eze Babilọn, onye dọtara ha nʼagha buru ha laa nʼala ọzọ. Ha lọghachitere na Jerusalem nakwa Juda, onye ọbụla nʼobodo nke aka ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehemaya 7:6
10 Iomraidhean Croise  

Ma ndi ala ahu nke fọduru, bú ndi fọduru n'obodo, na ndi dapuru adapu, bú ndi dapuru jekuru eze Babilon, na ndi fọduru n'etiti igwè madu, ndia ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ha je biri n'ala ọzọ.


Ka eze mara, na ayi jere n'ala anāchi achi, bú Juda, rue ulo Chineke uku, ma anēwere nkume nkpọrè wue ya, anēdo kwa osisi nime mb͕idi, anālu kwa ọlu a ọsọsọ, ọ nāga kwa nke-ọma n'aka-ha.


Ewe chọta akwukwọ-npiakọta n'Ekbatar, n'ulo uku nke di n'ala anāchi achi, bú Midia, ma ihe-ncheta di nime ya nke edeworo otú a.


Ha we sim, Ndi fọduru, bú ndi fọduru site na ndọta-n'agha n'ebe ahu n'ala ahu anāchi achi nọ n'ọnọdu ọjọ na n'ita-uta: etipúsi-kwa-ra mb͕idi Jerusalem, sure kwa ọnu-uzọ-ama-ya nile ọku.


ndi nābia, ha na Zerubabel, na Jeshua, na Nehemaia, na Azaraia, na Raamia, na Nahamani, na Mọdekai, na Bilshan, na Misperet, na Bigvai, na Nehum, na Beana. Ọnu-ọgugu ndikom nke ndi Israel:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan