Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehemaya 7:1 - Bible Nso

1 O rue, mb͕e alusiri mb͕idi ahu, mb͕e m'guzosi-kwa-ra ibo-ọnu-uzọ-ya nile, mb͕e emesi-kwa-ra ndi-ọnu-uzọ-ama na ndi-ọbù-abù na ndi-Livai ka ha lekọta ozi-ha,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Mgbe e wuzichara mgbidi ahụ, na mgbe m guzobesịrị ibo nʼọnụ ụzọ ya niile nʼọnọdụ ha, họpụtakwa ndị ọbụ abụ na ndị nche, na ndị Livayị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehemaya 7:1
12 Iomraidhean Croise  

Ha we bia, kpọ onye-ọnu-uzọ-ama obodo òkù, gosi ha, si, Ayi bara n'ọmuma-ulo-ikwū Siria, ma, le, ọ dighi nwoke nọ n'ebe ahu, ọ dighi kwa olu madu di, ma inyinya elibere elibe, na inyinya-ibu elibere elibe, na ulo-ikwū otú ha di.


Hezekaia we guzo òkè nile nke ndi-nchu-àjà na ndi Livai, dika òkè nile ha si di, nwoke ọ bula dika òfùfè-ya si di, ma ndi-nchu-àjà ma ndi Livai, ichu àjà-nsure-ọku na àjà-udo, ije ozi, na ikele ekele, na ito Chineke n'ọnu-uzọ-ama nile nke ọmuma-ulo-ikwū Jehova.


Ma n'arọ nke-abua nke ọbibia-ha nke ha biaruru ulo Chineke nime Jerusalem, n'ọnwa nke-abua, ha malitere, bú Zerubabel nwa Shealitiel, na Jeshua nwa Jozadak, na ndi fọduru n'umu-nne-ha, bú ndi-nchu-àjà na ndi Livai, na ndi nile ndi nēsi na ndọta-n'agha ahu bia na Jerusalem; ha we guzo ndi Livai, site n'onye b͕ara orú arọ ga n'iru, ibu ndi-isi n'ije-ozi nke ulo Jehova.


N'ihi na umu Israel na umu Livai gēwebata àjà-nbuli nke ọka na manya-vine ọhu na manu n'ime-ulo, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ihe nile nke ebe nsọ di, ha na ndi-nchu-àjà ndi nēje ozi, na ndi-ọnu-uzọ-ama, na ndi-ọbù-abù: ayi agaghi-arapu kwa ulo Chineke-ayi.


Ma ndia bu ndi-isi ala ahu anāchi achi ndi biri na Jerusalem: ma n'obodo nile nke Juda ka ndi ọzọ biri, nwoke ọ bula n'ihe-onwunwe-ya n'obodo nile ha, bú Israel, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na Netinim, na umu ndi-orù Solomon.


Ndi-isi ndi Livai kwa: Hashabaia, na Sherebia, na Jeshua nwa Kadimiel, na umu-nne-ha ndi nọ na ncherita-iru ha, ito Chineke na ikele ekele, dika ihe Devid, bú onye nke Chineke, nyere n'iwu si di, otù ihe-ndebe nēcherita ihe-ndebe ọzọ iru.


O rue, mb͕e Sanbalat, na Tobaia, na Geshem, bú onye Arebia, na ndi-iro-ayi fọduru, nuru na m'lusiri mb͕idi ahu, na ọ dighi kwa ntipú fọduru nime ya; (ọ bu ezie na akaghm-eguzo ibo-ọnu-uzọ n'ọnu-uzọ-ama nile rue mb͕e ahu;)


Ewe luzue mb͕idi ahu n'ubọchi nke-orú-na-ise nke ọnwa Elul, n'ọgu ubọchi abua na iri na abua.


Ha nēkwu kwa okwu bayere ezi omume-ya nile n'irum, ha nēburu kwa okwum nile pukuru ya. Akwukwọ-ozi ka Tobaia ziri ime ka m'tua egwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan