Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehemaya 6:14 - Bible Nso

14 Chinekem, cheta Tobaia, cheta kwa Sanbalat, dika omume-ha ndia si di, ọzọ kwa, cheta Noadia, bú onye-amuma-nwayi, cheta kwa ndi-amuma fọduru, ndi nēme ka m'tua egwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 “Chineke m, cheta Tobaya na Sanbalat, nʼihi ihe ndị a niile ha mere, chetakwa Noadaya, bụ onye amụma nwanyị, na ndị amụma ndị ọzọ niile fọdụrụ, bụ ndị ahụ chọrọ ime ka m tụọ egwu.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehemaya 6:14
26 Iomraidhean Croise  

Chinekem, cheta ha, n'ihi na ha emewo ka agua ọlu-nchu-àjà, na ọb͕ub͕a-ndu ọlu-nchu-àjà, na nke ndi Livai, n'ihe nādighi nsọ.


Chinekem, chetaram ihe nile nke m'meworo n'ihi ndi nka, imerem ezi ihe.


Jehova, cheta ubọchi Jerusalem Megide umu Edom; Ndi nāsi, B͕abanu ya ọtọ, b͕abanu ya ọtọ, Rue ntọ-ala di nime ya.


Chinekem, Chinekem, n'ìhi gini ka I rapurum? N'ìhi gini ka I nọ m n'ebe di nzọputam na okwu nile nke ọb͕ub͕ọ-ujam anya?


Chineke, ọ bu Chinekem ka I bu; anamachọsi Gi ike: Akpiri Gi akpọwo nkpuru-obim nku, anu-arum achọsiwo Gi ike, N'ala ọkpọ-nku na nke ida-#mbà, ebe miri nādighi.


Miriam, bú nwayi-amuma, bú nwa-nne-nwayi Eron, we were egwú-otiti n'aka-ya; ndinyom nile we chiri egwú-otiti na ite-egwú soro ya pua.


N'ihi nka ka Jehova ji kwue okwu di otú a bayere ndi-amuma ahu ndi nēbu amuma n'aha m, ma Mu onwem eziteghi ha, ma ha onwe-ha nāsi, Mma-agha na oké unwu agaghi-adi n'ala nka: Ọ si, Agēji mma-agha, ji kwa oké unwu, me ka ndi-amuma ahu gwusia.


Ọ buru na apuam je n'ọhia, le, ndi ejiworo mma-agha b͕u! ma ọ buru na abàm n'obodo a, le, ndi nāria ọria site n'oké unwu! n'ihi na ma onye-amuma ma onye-nchu-àjà, ha akpaghariwo n'ala, ma ha amaghi ihe.


O rue, n'arọ ahu, na nmalite ọbubu-eze Zedekaia, bú eze Juda, n'arọ nke-anọ, n'ọnwa nke-ise, na Hananaia nwa Azua, bú onye-amuma, nke sitere na Gibeon, gwaram okwu n'ulo Jehova, n'anya ndi-nchu-àjà na ndi Israel nile, si,


Hananaia, bú onye-amuma, we kopu nkpọrọ ahu n'olu Jeremaia, bú onye-amuma, we b͕ajie ya.


Jeremaia, bú onye-amuma, we si Hananaia, bú onye-amuma, Biko, nuru, Hananaia; Jehova eziteghi gi; ma gi onwe-gi emewo ka ndi nka tukwasi okwu-ugha obi.


Ọtutu ndi-amuma ugha gēbili kwa, duhie kwa ọtutu madu.


N'ihi na Kraist ugha di iche iche na ndi-amuma ugha gēbili, gosi kwa ihe-iriba-ama uku di iche iche na ọlu-ebube uku di iche iche; iduhie ọbuná ndi arọputara, ma ọ buru na ọ gēkwe me.


Nēzenu ndi-amuma ugha, ndi nābiakute unu n'ihe-oyiyi aturu, ma n'ime ha bu agu nāpunara aturu.


Ma otù uzọ ahu Janis na Jambris guzogidere Moses, otú a ka ndia nēguzogide kwa ezi-okwu ahu; bú madu ndi mebiworo n'uche, ndi ajuru aju n'ihe bayere okwukwe-ayi.


Ọ buru na onye ọ bula ahú nwa-nna-ya ka ọ nēmehie nmehie nke nādighi-eweta ọnwu, ọ gāriọ aririọ, Chineke gēnye kwa ya ndu inye ndi nēmehie nmehie ahu nke nādighi-eweta ọnwu. Nmehie di nke nēweta ọnwu: ọ bughi ekpere bayere nka ka m'nāgwa ya ka o kpe.


Ewe jide anu-ọhia ahu, ya na onye-amuma ugha ahu nke nēme ihe-iriba-ama ahu n'iru ya, bú nke o ji duhie ndi natarari akàrà nke anu-ọhia ahu, na ndi nākpọ isi ala nye ihe-oyiyi-ya: ewe tubà ha abua na ndu nime ọdọ ọku ahu nke ji brimstone nēre:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan