Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehemaya 6:10 - Bible Nso

10 Ma mu onwem batara n'ulo Shemaia nwa Delaia nwa Mehetabel, ma emechidoworo onye ahu uzọ; o we si, Ka ayi zukọta n'ulo Chineke, n'etiti ulo uku Chineke, ka ayi mechi kwa uzọ nile nke ulo uku Chineke: n'ihi na ha nābia ib͕u gi; e, n'abali ka ha nābia ib͕u gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Otu ụbọchị, a gara m nʼụlọ Shemaya, nwa Delaya, nwa Mehetabel, onye e mechibidoro ụzọ nʼụlọ ya. Ọ sịrị m, “Ka anyị zukọta nʼụlọ Chineke, nʼime ụlọnsọ, ka anyị mechiekwa ụzọ niile nke ụlọnsọ ahụ, nʼihi na ndị ikom na-abịa igbu gị, e, nʼabalị ka ha na-abịa igbu gị.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehemaya 6:10
21 Iomraidhean Croise  

Beal-hanan nwa Akboa we nwua, Heda we buru eze n'ọnọdu ya: aha obodo-ya bu Pau; aha nwunye-ya bu Mehetabel nwa Matred, bú nwa-nwayi Me-zahad.


O wu-kwa-ra okpukpu-ulo n'akuku mb͕idi ulo ahu buruburu, bú mb͕idi nile nke ulo ahu buruburu, ma nke ulo uku Chineke ahu, ma nke ime-ime-ulo ahu: o me-kwa-ra ulo ntà nke akuku buruburu:


O we nọ n'aka-ya n'ulo Jehova nēzo onwe-ya arọ isi: Atalaia we buru eze ala ahu.


Ulo nile nke Ehab gāla kwa n'iyì: M'gēbipu kwa n'aru Ehab nwa-nwoke ọ bula, na onye eb͕ochiri eb͕ochi na onye arapuru arapu n'Israel.


Ehaz we chikọta ihe nile nke ulo Chineke, b͕u ngwongwo ihe nile nke ulo Chineke, mechie ọnu-uzọ nile nke ulo Jehova, mere onwe-ya ebe-ichu-àjà di iche iche nime nkuku nile nime Jerusalem.


Onye ahu, n'arọ mbu nke ọ bu eze, n'ọnwa mbu, o meghere uzọ ulo Jehova, me ka ha di ike.


Ọzọ, ha emechiwo ọnu-uzọ nile nke uzọ-nbata, menyu oriọna nile, ha esureghi kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ha esureghi kwa àjà-nsure-ọku, n'ebe nsọ ahu, nye Chineke Israel.


Na n'etiti umu Harim; Elieza, na Ishija, na Malkija, na Shemaia, na Shimeon;


M'we zìe kpọ Elieza, kpọ kwa Ariel, kpọ kwa Shemaia, kpọ kwa Elnetan, kpọ kwa Jarib, kpọ kwa Elnetan, kpọ kwa Netan, kpọ kwa Zekaraia, kpọ kwa Meshulam, bú ndi-isi; m'kpọ kwa Joiarib, kpọ kwa Elnetan, bú ndi-nghọta.


M'we mata, ma, le, ọ bughi Chineke zitere ya: kama okwu amuma nka ka o kwuru imegidem: ma Sanbalat na Tobaia goro ya.


Ihe-efu ka ha nēkwurita, otù onye na ibe-ya: Eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwu okwu ire-utọ na obi abua ka ha ji ekwu.


Onye nēmebi iwu nēzube ajọ ihe imegide onye ezi omume, Ọ nātakwasi kwa ya ikekere-ezé.


Ọnu-ya ka onye emeruru emeru ji ebibi madu-ibe-ya: Ma ihe-ọmuma ka agēji dọputa ndi ezi omume.


Jeremaia we nye Beruk iwu, si, Mu onwem bu onye eb͕ochibidoworo; apughm ibà n'ulo Jehova:


Mọ Chineke we bata nimem, me ka m'guzo n'ukwum abua; O we kpayerem uka, sim, Bia, mechibido onwe-gi uzọ n'etiti ulo-gi.


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na otù onye di n'etiti unu nke nēmechi uzọ, ka unu we ghara ifunwu ọku nke ebe-ichu-àjàm n'efu! ọ dighi ihe-unu nātọm utọ, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, M'gaghi-anara kwa onyinye-inata-iru-ọma n'aka-unu nke-ọma.


Nēzenu ndi-amuma ugha, ndi nābiakute unu n'ihe-oyiyi aturu, ma n'ime ha bu agu nāpunara aturu.


N'ihi na onye ọ bula nke nēme ihe nādighi nma nākpọ Ìhè ahu asì, ọ dighi-abiakute kwa Ìhè ahu, ka aghara itu ya ọlu-ya nile n'anya.


Obodo ahu dum we me uṅara, ndi-Ju we b͕akọta: ha we jide Pọl, dọkpupu ya n'ulo uku Chineke: ngwa ngwa ewe mechie ọnu-uzọ nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan