Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehemaya 5:9 - Bible Nso

9 M'we si, Ọ dighi nma, bú ihe a nke unu onwe-unu nēme: ọ̀ bughi n'egwu Chineke ka unu gējeghari, n'ihi ita-uta nke ndi mba ọzọ, bú ndi-iro-ayi?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Agwakwara m ha okwu ọzọ sị, “Ihe unu na-eme jọrọ njọ. O kwesighị ka unu tụọ egwu Chineke si otu a gbanarị nkọcha nke ndị iro anyị, bụ ndị mba ọzọ?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehemaya 5:9
21 Iomraidhean Croise  

Abraham we si, N'ihi na asirim, N'ezie ọ dighi egwù Chineke di n'ebe a; ha gēb͕ukwam n'ihi okwu bayere nwunyem.


Josef we si ha n'ubọchi nke-atọ, Menu nka, di-kwa-nu ndu; n'ihi na Chineke ka mu onwem nātu egwu:


Otú ọ di, n'ihi na i mewo ka ndi-iro Jehova kpọlu nkpọlu nke-uku n'okwu a, nwa-nwoke nke amuru gi aghaghi inwu kwa.


Nuru, Chineke-ayi; n'ihi na ayi bu ndi eledaworo anya: Gi me kwa ka ita-uta-ha laghachi n'isi-ha, Gi rara kwa ha nye ibu ihe-nluta-n'agha n'ala ndọta-n'agha:


Ọzọ kwa, mu onwem na umu-nnem na ndi nējerem ozi nēbinye ha ego na ọka n'ọmuru-nwa. Biko, ka ayi rapu ọmuru-nwa nka.


Ma ndi mbu nāchi ala ndi burum uzọ, ha bob͕uru ndi-Ju ibu arọ́, we nara ha utu n'achicha na manya-vine, tiyere ọgu shekel ọla-ọcha abua; ọbuná ndi nējere ha ozi bu ndi-isi n'ebe ndi-ayi nọ: ma mu onwem emeghi otú a, n'ihi egwu Chineke.


Ònye mara ike nke iwe-Gi, Na nrubiga-ókè nke iwe-Gi dika egwu nke kwesiri Gi si di?


Onye nēme ihe-ike nārà madu-ibe-ya urà, Nēme kwa ka o je ije n'uzọ nādighi nma.


Ọzọ, iri onye ezi omume nra adighi nma, Ọ dighi kwa nma itib͕u ndi amara aha-ha n'ihi izi-ezi-ha.


Ihu onye nēmebi iwu iru-ọma adighi nma, Iwezuga onye ezi omume n'ikpé. Eb͕ub͕ere-ọnu abua nke onye-nzuzu nābà n'ilu-ọ̀gù,


Ọzọ, mb͕e nkpuru-obi nēnweghi ihe-ọmuma ọ dighi nma; Onye ukwu-ya nēme ngwa nēhie uzọ.


Ndia bu kwa okwu nke ndi mara ihe. Imata iru madu n'ikpé adighi nma.


Ha we biarue mba nile ebe ha biara, ha we me ka aha nsọm ghara idi nsọ; mb͕e anēkwu okwu bayere ha, si, Ndi nke Jehova ka ndia bu, ọ bu kwa n'ala-Ya ka ha siri puta.


Anarala ya uma ma-ọbu ọmuru-nwa; ma tua egwu Chineke-gi: ka nwa-nne-gi we biyere gi.


Ya mere nzukọ Kraist nime Judia na Galili na Sameria dum nwere udo, ebe anēwuli ya elu dika ulo; ọ nāba kwa uba, ebe ọ nāga n'egwu Onye-nwe-ayi na nkasi-obi nke Mọ Nsọ.


N'ihi na anēkwulu aha Chineke n'etiti ndi mba ọzọ n'ihi unu, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ.


Ya mere anamezube ka umu-ab͕ọghọ ndi di-ha nwuru luru di, mu kwa umu, nāchi kwa èzí-na-ulo-ha, ghara kwa inye onye nēmegide ayi ihe o gēji kwutọ:


ndi uche-ha zuru okè, ndi di ọcha, ndi nālu ọlu n'ulo, ezi madu, ndi nēdo onwe-ha n'okpuru di nke aka ha, ka ewe ghara ikwulu okwu Chineke:


nēbinu obi-unu nke-ọma n'etiti ndi mba ọzọ; ka ha we site n'ọlu ọma nile unu, nke ha nēle anya, nye Chineke otuto n'ubọchi nleta ahu nime ihe ahu ha nēkwutọ unu nime ya dika ndi nēme ihe ọjọ.


É-è, umum; n'ihi na ọ dighi nma, bú akukọ nke mu onwem nānu: unu nēme ka ndi Jehova jehie.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan