Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehemaya 5:8 - Bible Nso

8 M'we si ha, Ayi onwe-ayi ab͕aputawo umu-nne-ayi, bú ndi-Ju, ndi erenyere ndi mba ọzọ, dika aka-ayi ruru; ùnu onwe-unu gēre kwa umu-nne-unu, àgērenye kwa ayi ha? Ha we b͕a nkiti, ha ahughi kwa okwu ha gāza.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Nʼụbọchị nzukọ ahụ, agwara m ha okwu sị, “Ọtụtụ nʼime anyị na-agbalị nʼụzọ niile ịhụ na anyị zụtaghachiri ụmụnna anyị ndị Juu bu ndị e resiri ndị mba ọzọ. Ma unu nọ nʼebe a na-agbalị ime ha ka ha ghọọ ndị ohu unu. Ruo ole mgbe ka anyị ga-anọgide na-agbapụta ha site nʼọnọdụ ibu ohu?” Ma ha niile ekwughị okwu ọbụla, nʼihi na ha enweghị ihe ha ga-ekwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehemaya 5:8
14 Iomraidhean Croise  

M'we si, Ọ dighi nma, bú ihe a nke unu onwe-unu nēme: ọ̀ bughi n'egwu Chineke ka unu gējeghari, n'ihi ita-uta nke ndi mba ọzọ, bú ndi-iro-ayi?


Anubìri olu ndi-ndú, Ire-ha rapa-kwa-ra n'okpo-ọnu-ha;


Ha atuwo ujọ, ha azaghi kwa ọzọ: Ha ewepuwo okwu nile n'ọnu onwe-ha.


Onye nēzu madu n'ori re ya, ma-ọbu na asi na ahu ya n'aka-ya, aghaghi ime ka ọ nwua.


o we si ya, Eyìm, ì si aṅa bata n'ebe a nēyighi uwe ọlulu-nwunye? Ma o kpuchiri ọnu.


Otù ka ọ nyere talent ise, nke-ọzọ talent abua, nke-ọzọ otù talent; o nye onye ọ bula dika ike nke aka ya ra; o we je inọdu n'ala ndi ọzọ.


N'ihi na onye ọ bula nke nwere ka agēnye, ọ gēnwebiga kwa ókè: ma site n'aka onye nēnweghi, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya.


N'ihi na asi na n'ihi ihe-oriri ọ nēwuta nwa-nna-gi, i dighi-ejeghari ọzọ dika ihu-n'anya si di. Ewela ihe-oriri-gi la onye ahu n'iyì, bú onye Kraist nwuru n'ihi ya.


Ma ayi matara na ka ha ra, bú ihe iwu Chineke nēkwu, ọ nāgwa ndi nọ n'okpuru iwu ahu; ka ewe kpuchita ọnu nile n'otù n'otù, ka ewe kwe na ikpé mara uwa nile n'ebe Chineke nọ:


N'ihi na site n'ihe-ọmuma-gi onye ahu nke nādighi ike nāla n'iyì, bú nwa-nna-gi nke Kraist nwuru n'ihi ya.


N'ihi na asi na obi di ọku di ya, ọ bu ihe agānara nke-ọma dika ihe ọ bula madu nwere si di, ọ bughi dika ihe ọ nēnweghi.


Ya mere otú a, otú ayi nwere oge, ka ayi nālu ezi ihe n'ebe madu nile nọ, ma ka ayi nālu ezi ihe karisia n'ebe ndi èzí-na-ulo nke okwukwe-ayi nọ.


Mb͕e agāhu onye ọ bula ka o nēzu madu n'ori sitere n'umu-nne-ya, sitere n'umu Israel, o we nēme ya dika orù, ma-ọbu re ya; onye-ori ahu gānwu kwa: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan