Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehemaya 5:18 - Bible Nso

18 Ma ihe nke edoziworo bayere otù ubòchi bu otù ehi na aturu isi arọputara arọputa; edozi-kwa-ra umu-nnunu nyem, dozi kwa manya-vine nile ọ bula n'uba otù ub͕ò n'ubọchi iri: ma n'ihe a nile ọ dighi nri nke diri onye nāchi ala m'chọrọ, n'ihi na òfùfè ahu di arọ́ n'aru ndi nka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Ihe na-ezu nri a na-eri nʼụlọ m kwa ụbọchị bụ otu ehi na atụrụ isii gbara abụba, na ọtụtụ ọkụkụ, na ụdị mmanya dị iche iche a na-ebubata kwa ụbọchị iri ọbụla. Nʼagbanyeghị nke a, ọ dịghị mgbe ọbụla m nara site nʼaka ha ụtụ ihe oriri nke onye na-achị ala kwesiri inweta, nʼihi na ha onwe ha nọ na mkpa dị ukwuu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehemaya 5:18
6 Iomraidhean Croise  

Gi onwe gi amawo Devid, bú nnam, na ọ pughi iwuru aha Jehova, bú Chineke-ya, ulo n'ihi agha nke b͕ara ya buruburu, rue mb͕e Jehova tiyere ha n'okpuru ọbu-ukwu-ya abua.


Onye nēmebi iwu nēbiri ihe, ma ọ dighi-akwughachi: Ma onye ezi omume nēme amara, nēnye kwa enye.


Ogologo ubọchi nile ka ọ nēme amara, nēbinye kwa ihe; Nkpuru-ya bu kwa ndi agọziri agọzi.


ayi erighi kwa nri n'aka onye ọ bula n'efu, kama n'idọb͕u onye-ayi n'ọlu na ihuju-anya, nālu ọlu abali na ehihie, ka ayi we ghara ibob͕u onye ọ bula nime unu:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan