Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehemaya 4:21 - Bible Nso

21 Ayi onwe-ayi we nālu ọlu n'ije-ozi ahu: ma nkera-ha nēji ube site na chi-ọbubọ rue mb͕e kpakpando putara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Ya mere, anyị nọgidere nʼọrụ anyị site nʼìhè mbụ nke ụtụtụ rụọ mgbe kpakpando pụtara. Ọkara nʼime ndị ọrụ jikwa ùbe nọrọ na nche.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehemaya 4:21
6 Iomraidhean Croise  

N'ebe ọ bula unu nuru olu opì-ike, n'ebe ahu ka unu gāchikọta onwe-unu n'ebe ayi nọ; Chineke-ayi gēburu ayi agha.


Ọzọ, na mb͕e ahu m'siri ndi-ayi, Ka nwoke ọ bula na onye nējere ya ozi nọ ọnọdu-abali n'etiti Jerusalem, ka ha we buru ayi ndi-nche n'abali, je kwa ozi n'ehihie.


Ma site n'amara Chineke abum ihe m'bu: ahu-kwa-ra na amara-Ya nke enyerem abughi ihe-efu; kama adọb͕ubigaram onwem ókè n'ọlu kari ha nile: ma ọ bughi mu onwem, kama amara Chineke nke sorom.


Ya mere, umu-nnam m'huru n'anya, guzosienu ike, burunu ndi anāpughi iropu eropu, ndi nālubiga ọlu Onye-nwe-ayi ókè mb͕e nile, ebe unu matara na ndọb͕u unu nādọb͕u onwe-unu n'ọlu abughi ihe-efu nime Onye-nwe-ayi.


Ma ike agwula ayi n'obi n'ime ihe ọma: n'ihi na ayi gēweta ihe-ubi mb͕e oge-ya ruru, ma ayi adaghi #mbà.


anamadọb͕u kwa onwem n'ọlu ime ihe a, nāb͕asi nb͕a ike dika i1usi-ọ1u-ike nke Ya si di, nke nālusi ike nimem n'ike.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan