Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehemaya 4:2 - Bible Nso

2 O kwue okwu n'iru umu-nne-ya na usu-ndi-agha Sameria, si, Gini ka ndi-Ju ndia ndi nāta aru nēme? hà gārapuru onwe-ha ihe? hà gāchu àjà? hà gēme ka ọlu-ha gwusia n'otù ubọchi? hà gēsi n'obo ájá me ka nkume di adi ọzọ, ebe nkume ahu nile bu ihe akpọworo ọku?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Nʼihu ndị otu ya na ndịisi agha Sameria, o kwuru si, “Gịnị ka ndị Juu ole na ole a na-adịghị ike na-eme? Ha na-achọ iwugharị mgbidi obodo a? Ha ga-achụ aja? Ha ga-arụcha ọrụ niile nʼotu ụbọchị? Ha ga-esita nʼaja a kụpịasịrị akụpịa mee ka nkume ndị a dị ndụ, ka ọ bụ site na nkume ochie ndị a akpọrọ ọkụ?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehemaya 4:2
17 Iomraidhean Croise  

O rue na ndi ala ahu nēme ka aka ndi Juda ghara idi ike, ha nēme kwa ka ha tua egwu n'iwu ulo,


Ma n'ira mb͕idi Jerusalem nye Chineke ha chọputara ndi Livai n'ebe-ha nile, ime ka ha biarue Jerusalem, ime ememe nke ira mb͕idi Jerusalem nye Chineke, ọbuná n'iṅuri-ọṅu, na n'ikele-ekele, na n'ibù-abù, n'ájà na une na n'ubọ-akwara.


Ha we chua àjà uku n'ubọchi ahu, we ṅuria; n'ihi na Chineke mere ka ha ṅuria ọṅu uku; ọzọ kwa, ndinyom-ha na umu-ntakiri-ha ṅuriri: ewe nu ọṅù Jerusalem rue ebe di anya.


Juda we si, Ike nke ndi-ibu ebilatawo, ma nkpọnkpọ-ihe riri nne; ayi onwe-ayi apughi kwa ilu mb͕idi.


Ewe luzue mb͕idi ahu n'ubọchi nke-orú-na-ise nke ọnwa Elul, n'ọgu ubọchi abua na iri na abua.


Ha asiwo, Jenu, ka ayi zopu ha n'ibu mbe; Agaghi-echeta kwa aha Israel ọzọ.


Maika onye Moreshet nēburi amuma n'ubọchi Hezekaia, bú eze Juda; o we gwa ndi Juda nile okwu, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Agēji ploughi gwu Zaion dika ubi, Jerusalem gāghọ kwa obo-ihe obo-ihe, ugwu nke ulo ahu gādi kwa ka ebe di elu nke oké ọhia.


Ì hughi ihe ndi nka kwuworo, si, Ab͕uru abua nke Jehova rọputara, Ọ juworo ha? ọ bu kwa ndim ka ha nēlelì anya, ha we ghara ibu kwa mba n'iru ha ọzọ.


Ma mara, were kwa uche mata, na site na nputa okwu ahu iwughachi na iwuzi Jerusalem rue mb͕e onye etere manu, bú onye-ndú, gādi ízù asa: na ọgu atọ na abua, agēwuzi kwa ya ọzọ, ya na amá na ékpè, ọbuná na nkpà nke mb͕e ndia.


Jehova, anuwom ihe anuru bayere Gi, m'tua egwu: Jehova, tute ọlu-Gi n'etiti arọ nile, N'etiti arọ̀ nile ka I gēme ka amara ya; N'oké iwe cheta obi-ebere.


N'ubọchi ahu ka Jehova gēb͕ochi ndi bi na Jerusalem; onye nāsu ngọngọ n'etiti ha n'ubọchi ahu gādi kwa ka Devid; ulo Devid gādi kwa ka Chineke, dika mọ-ozi nke Jehova n'iru ha.


N'ihi na ònye ledaworo ubọchi ihe ntà anya? n'ihi na ha gāṅuri ọṅu, hu nkume eji atù mb͕idi n'aka Zerubabel, bú asa ndia, ndi bu anya Jehova; ndi ahu nējeghari n'uwa nile.


Kama ọ bu ihe-nzuzu nke uwa ka Chineke rọputara, ka O we me ka ihere me ndi mara ihe; ọ bu kwa ihe nādighi ike nke uwa ka Chineke rọputara, ka O we me ka ihere me ihe di ike;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan