Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehemaya 4:17 - Bible Nso

17 Ndi nālu mb͕idi n'elu mb͕idi ahu na ndi nēbu ibu nēbo onwe-ha ibu, nwoke ọ bula nēwere otù aka-ya lu ọlu n'ije-ozi ahu, ma otù aka-ya nēji ihe-agha-ya;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Ndị na-edo nkume na ndị ọrụ ọbụla debere ngwa ọgụ ha nʼebe ọ ga-eru ha aka mgbe ọbụla ha na-arụ ọrụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehemaya 4:17
15 Iomraidhean Croise  

M'we guzo ndi-ayi n'ebe nile dikarisiri ala nke ebe di nime mb͕idi, n'ebe nile sara mbara, m'we guzo ndi-ayi dika ab͕uru nile ha si di, ha na mma-agha-ha, na ube-ha, na uta-ha.


O rue, site n'ubọchi ahu, na nkera ndi nējerem ozi nālu ọlu n'ije-ozi ahu, ma nkera nime ha nēji ube na ọta na uta na uwe-agha; ndi-isi nọ kwa n'azu ulo Juda nile.


ndi nālu mb͕idi kwa, nwoke ọ bula na mma-agha-ya ekeworo n'úkwù-ya nọ, ha we nālu mb͕idi otú a. Onye nāfù opì-ike nọ kwa n'akukum.


Ka nbuli-elu Chineke di n'olu abu ha, Ka mma-agha nke iru abua di kwa n'aka-ha;


Ha nile ji mma-agha, ha bu ndi emeworo ka ha muta ibu agha: Onye ọ bula, mma-agha-ya di n'úkwù-ya, N'ihi egwu n'abali.


Ma mara, were kwa uche mata, na site na nputa okwu ahu iwughachi na iwuzi Jerusalem rue mb͕e onye etere manu, bú onye-ndú, gādi ízù asa: na ọgu atọ na abua, agēwuzi kwa ya ọzọ, ya na amá na ékpè, ọbuná na nkpà nke mb͕e ndia.


Ha adighi-enurita onwe-ha; onye ọ bula n'uzọ-ya atuliri atuli, otú a ka ha nāga ije: ọ bu kwa n'etiti ihe-agha ka ha nāda nējebìghi ije-ha.


Nēchenu nche, nēguzosinu ike n'okwukwe-unu, burunu ndikom, nādinu ike.


n'ihi na emegheworom ọnu-uzọ di uku nke agēji kwa lusi ọlu ike, ọzọ, ọtutu ndi nēmegidem.


Ọ buru na ndi ọzọ eketa ike a n'ebe unu nọ, àyi onwe-ayi adighi-eketa kari? Otú ọ di, ayi ejighi ike a nara ihe; kama ayi nānagide ihe nile, ka ayi we ghara ib͕ochi ozi ọma Kraist n'uzọ ọ bula.


nime okwu nke ezi-okwu, nime ike nke Chineke; site n'ihe-agha nke ezi omume n'aka-nri na aka-ekpe,


ghara ikwe ka ndi nēmegide unu me ka unu tua ujọ n'ihe ọ bula: ebe nke ahu bu ihe nēme ka ila-n'iyì putara ha ìhè, ma ọ nēme ka nzọputa-unu puta ìhè, nka site-kwa-ra na Chineke;


Som hujukọ anya, dika onye-agha ọma nke Kraist Jisus.


Ab͕asiwom nb͕a ọma ahu, ab͕asiwom ọsọ ahu, edebesiwom okwukwe ahu:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan